NDI GỌVỌNỌ APC IRI ABỤỌ NA ANỌ AKWADOLA BUHARI NA IWETA OCHỊCHỊ OYEGUN NA NJEDEBE.

Spread the love

Ka ọgachara ihe dika awa iri abụa na anọ ndi gọvọnọ APC nakwa onye isi ala bụ Buhari nwechara nzukọ  nke biara na mmechi n’ụdị ndi kwere ma ndi ekweghị gbasara chịrị gaba ndi gọvọnọ na agwa ndi isi ọrụ APC akpọrọ National Working Committee NWC n’aha nkenke,  ndi gọvọnọa enwele nchegharị ma kwere na aga-ahọgharị ọkwa na alaka gọmenti atọ enwere n’ala anyị.

Ka ihe siri kwụrụ kịta, ndi gọvọnọ iri abụọ na anọa akwadola ka eweta ọchchị onye isi otu ọchịchị a bụ John Odigie-Oyegun na ndi ọrụ ya ndi ọzọ na njedebe.

Onye isi ala bụ Buhari na ndi gọvọnọ APC iri abụọ na anọ nwere nzụkọ n’obi gọmenti dị n’Abuja na ụbọchị Tusdee gara aga maka ileba anya na mkpu chịrị gaba ana etiso ndi ọrụ NWC nke APC, nke ọtụtụ ndi gọvọnọa na-eti.

Mgbe ọ na-agwa ndi nta akụkọ obi gọmenti okwu ka ha na onye isi ala nwechara nzukọ, onye isi oche otu ndi gọvọnọ ala anyị akpọrọ Nigeria Governors Forum, NGF, n’aha nkenke, ma bụrụkwa aka na-achị steeti Zamfara bụ Abdulaziz Yari kọwara na nzọkọ ha mere na Tusdee banyere Wenesdee ka ha were nwee ike ịdụtụ ọnụ ofọma. Ọ sị na nkea mere ha ji kwekọrita na ha na onye isi ala ga-anọ n’otu ụgbọ.

Gọvọnọ Yari sịrị na ha na ndi NWC ga-enwe nzukọ iji weputa aha ndi nakwa usoro aga-eji hazie ma kpokọba ọgbakọ nhọgharia.

N’okwu ya ọsiri, ‘ndi nta akụkọ, unu matara n’ụnyahụ, na anyị gbachiri unu nkịtị atụrụ gbara egbe ka anyị nwesiri nzukọ. Nkea mere n’ụtụtụa, anyị hụrụ ọtụtụ isi okwu ọtụtụ akwụkwọ akụkọ na-ekwu na anyị nwere nghọtahie banyere onye isi oche otu ọchịchị anyị nakwa usoro ọchịchị anyị’.

Leave a Reply

Your email address will not be published.