NDI OMEBE IWU EKWENYEGHỊ NA AKA ONYE ISI ALA BINYERE MAKA ỊTỤ NGWA AGHA

Spread the love

Ndi omebe iwu ala anyị ngalaba sinet ekwoola na ha ekwenyeghị n’aka ahụ onye isi ala binyere ka ewere ego dị otu njeri dola tụọ ngwa agha.

Na Wenesday gara aga ka onye isi ala bụ Buhari binyere aka ka ewere ego dị otu njeri dọla tọọ ngwa agha iji bagide ọgụ ana-alụ megide ndi ogbu n’iké bụ Boko Haram.

N’ihi nkea ndi omebe iwu anyị egosila iwe ha n’ihi na ọbụ nanị ha bụ ndị enyere ikikere ibinye aka n’imefu ụdị egoa.

Ndi omebe iwua sịrị na ikikere ibinye aka ka ewepu ụdị egoa adịghịrị onye isi ala.

Osote onye isi oche ndi omebe iwu na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Sinetọ Ben Murray-Bruce, si n’otu ochịchị PDP, npaghara ọwụwa anyanwu Bayelsa kwuru na ndi ọrụ ụlọ ọrụ onye isi ala enweghị ike imefu ụdị egoa ma ndi omebe iwu akwadoghị ya. Ọsịrị na ebinyebeghị aka ka ewepụ egoa kama na ọka bụ nanị okwu ọnụ ka-ana-ekwu. Ọsịrị na ndi ụlọ ọrụ onye isi ala enweghị ike imefu ọbụladị otu kọpọ maka ụdị ihea belu sọ ma ndi omebe iwu binyere ya aka.

Ọgara nihu kwue n’ọbụ mgbe ndi omebe iwu kwekọrịtara, ka ndi ụlọ ọrụ onye isi ala ga-enwe ike imefu ụdị egoa.

Ọ sịri na oke na ọrụ dịrị ndi ụlọ ọrụ onye isi ala bụ ikwuputa mkpa ọdị bụ imefụ ụdị egoa ebe ndi omebe iwe nwe ọrụ ibinye aka n’ime ya.iké bụ Boko Haram.

N

Leave a Reply

Your email address will not be published.