ỌHANEZE EKWOOLA NA HA AGBACHI NKỊTỊ KA-AKATỌỌ AHA IKE EKWEREMADỤ

Spread the love

Ọhaneze Ndigbo adọla gọmenti etiti aka na ntị ka ọ gharakwa ikpacha anya katọọ aha onye osote onye isi ụlọ omebe iwu sineti ala anyị bụ Chief Ike Ekweremadụ.

Onye isi Ọhanezea bụ ichie Nnia Nwodo kwuru nkea mgbe ọ na-agwa ndi nta akụkọ okwu n’Enugwu. Ọsịrị na ebuboo ana-ebo Ekweremadụ bụ onye kachaa ndi Igbo niile welite isi na ndọrọ-ndọrọ ọchịchị kita sị na o riri ego, enweghị isi ebe enweghị ọkpụrụkpụ ihe akaebe agbadoro ụkwụ n’ebubooa

Ọhaneze kwuru na ha ga-akpọ ganị-ganị megide mbọ ọbụla aga-agba ịkatọ aha nwa amadia bụ Ike Ekweremadụ na nkịtị.

N’ụbọchị Tọsdee abalị ise nke ọnwa anọ n’afọa ka ichie Nnia Nwodo nọrọ n’Enugwu wee kwue na ọ bụ ihe ezighị ezi bụ gọmenti etiti ị na-enyonye anya na ndụ Ekweremadụ n’ụdị inye nwa nkịta ajọ aha ka-ewere dọgbue ya n’iké.

Nwodo kwukwara na ọbụ ihe ezighị ezi bụ ị sị Ekweremadụ zara ọnụ ya ebe enwebegh ihe ndi na-ebo ya ebuboo kudoro aka na nwa amadịa mere n’ụdị ka ya baa taa baa echi. Ọ sị na nkea bụ ikpọdo iwu isi n’ala.

Ọsịrị na Ekweremadụ bụ onye ndi Igbo niile na-akwanyere ugwu ma bụrụkwa onye wetagoro ndi mpaghara ya ọtụtụ ihe mmepo obodo na-enweghị ụzọ esibu enyo ya enyo ka mgbe ọ malitere ọrụ.

Onye isi Ọhanezea gosiri mgbagwoju anya ịhụta usoro ọchịchị na-ekpe mmadụ ikpe nanị maka na ọ nọ n’otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị obodo nkea mọbụ nke ọzọ, mọbụkwanụ ebe ana-enye mmadụ mgbaghara ihe ọjọọ ya niile maka na o so otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị nkea mọbụ nke ọzọ.

Nwodo kwuru na-enweela ọtụtụ ndi agha akagbugoro ebuboo ana ebo ha nanị maka na ha gbarapụrụ otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ha nọbu ma banye na nke ọzọ. Ọ gara n’ihu kwue na o nwere onye chịburu steeti Enugwu ana enyobu enyo mana kita na ya na onye isi ala na-erikọ na-añụkọ nanị maka na ọ hapụla otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ọ nọbụ wee gbaba na nke na-achị ugbua.

Nwodo dọrọ aka na ntị kwue na Ọhaneze agaghị abụzị okenye ọnọ n’ụlọ ewu mụọ n’ọgbụrị, ebe eji nwayọọ na-atọrọọ ụmụ afọ Igbo na-eme ha mmegbu na ala ha tụnyegoro ụtụ gbara dimkpa maka mmepo ya.

Ọ sịrị na ebe ọ bụ na otu okwu ịdọ aka na ntị ahụ ọtụtụ ndi ọzọ na-ekwu ka Ekweremadụ kwuru, na ya ahụghị ihe kpatara nke Ekweremadụ ga eji pụọ iche.

Nwodo siri n’ọbụ ụdị iche na mmadụ bụ ewua ana-egosi ndi Igbo mere ụmụ ha na-eto eto ji ekwu ka ahapụ ha ka ha jiri ụkwụ ha gaba, ebe akwọ ha n’azụ ma ụkwu ha na-akpụ n’ala.

Leave a Reply

Your email address will not be published.