ỌHANEZE NDIGBO EKWUOLA NA HA AGAGHỊ ANỌ AKATỌỌ AHA IKE EKWEREMADỤ

Spread the love

Ọhaneze Ndigbo adọọla Gọọmentị Etiti aka na ntị ka ọ gharakwa ikpacha anya katọọ aha onye osote onye isi ụlọ omebe iwu sineti ala anyị bụ Sinetọ Ike Ekweremadụ.

Onye isi Ọhaneze Ndigbo bụ Ichie Nnia Nwodo kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndi nta akụkọ okwu n’Enugwu. Ọ sịrị na ebubo a na-ebo Ekweremadụ bụ onye kachaa ndi Igbo niile welite isi na ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ugbua sị na o riri ego, enweghị isi ebe enweghị ọkpụrụkpụ ihe akaebe agbadoro ụkwụ n’ebubo a

Ọhaneze kwuru na ha ga-akpọ ganị-ganị megide mbọ ọbụla ana-agba ịkatọ aha nwa amadị a bụ Ike Ekweremadụ na nkịtị.

N’ụbọchị Tọsdee abalị ise nke ọnwa anọ n’afọ a ka Nwodo nọrọ n’Enugwu wee kwuo na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya bụ Gọọmenti Etiti ị na-enyonye anya na ndụ Ekweremadụ n’ụdị inye nwa nkịta ajọ aha ka-ewere dọgbue ya n’iké.

Nwodo kwukwara na ọ bụ ihe ezighị ezi bụ ịsị Ekweremadụ zara ọnụ ya ebe enwebeghị ihe ndi na-ebo ya ebubo kudoro aka na nwa amadị a mere n’ụdị ka ya baa taa baa echi. Ọ sị na nke a bụ ikpọdo iwu isi n’ala.

Ọ sịrị na Ekweremadụ bụ onye Ndigbo nile na- akwanyere ugwu ma bụrụkwa onye wetagoro ndi  mpaghara ya ọtụtụ ihe mmepo obodo na-enweghị ụzọ esibu enyo ya enyo ka mgbe ọ malitere ọrụ.

Onye isi Ọhaneze a gosiri mgbagwoju anya ịhụta usoro ọchịchị na-ekpe mmadụ ikpe nanị maka na ọ nọ n’otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị  nkea ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụkwanụ ebe ana-enye mmadụ mgbaghara ihe ọjọọ nile o mere maka na o so otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị nkea ma ọ bụ nke ọzọ.

Nwodo kwuru na enweela ọtụtụ ndi akagbugoro ebubo ana ebo ha nanị maka na ha gbarapụrụ otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ha nọbu ma banye na nke ọzọ. Ọ gara n’ihu kwuo na o nwere onye chịburu steeti Enugwu ana enyobu enyo mana kita na ya na onye isi ala na-erikọ na-añụkọ nanị maka na ọ hapụla otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ọ nọbụ wee gbaba na nke na-achị ugbua.

Nwodo dọrọ aka na ntị kwuo na Ọhaneze agaghị abụzị okenye ọnọ n’ụlọ ewu mụọ n’ọgbụrị, ebe eji nwayọọ na-atọrọọ ụmụ afọ Igbo na-eme ha mmegbu na ala ha tụnyegoro ụtụ dị ọkpụrụkpụ maka mmepe ya.

Ọ sịrị na ebe ọ bụ na otu okwu ịdọ aka na ntị ahụ ọtụtụ ndi ọzọ na-ekwu ka Ekweremadụ kwuru, na ya ahụghị ihe kpatara nke Ekweremadụ ga eji pụọ iche.

Nwodo siri n’ọbụ ụdị iche na mmadụ bụ ewu a ana-egosi Ndigbo mere ọtụtụ ntorọbịa Igbo ji esi ọnwụ maka nnwere onwe

Leave a Reply

Your email address will not be published.

seventeen − 13 =