OSINBAJO AKWADOLA IHAZIGHARI NIGERIA

Spread the love

Osote onye isi ala bụ ọka mmụta Yemi Osinbajọ nọrọ n’Ibadan bụ isi ọchịchị steeti Ọyọ n’ụbọchị Fraidee kwue na ya kwenyere na ganị ganị ọtụtụ ndi mmadụ na-akpọ ka ahazigharịa ala anyị.

Obụ ka ọ gasịrị ọgbakọ ndi isi ụka akpọrọ Great Nigeria Pastors conference, enwere n”ụlọ ọgwụ ọmụmụ ihe Mahadum dị n’Ịbadan ka ọgwara ndi nta akụkọ nkea. Ọ sịrị na ọ dị mkpa ka steeti anyị dị iche iche nwee ezigbo nnwere onwe, ma jiri aka ha hazie akụ n’ụba ha, si na ya kwalite ego nnweta ha nakwa nchekwa ha.

Ọ sịrị, na nhazigharịaṅ dị anyị mkpa, mana anyị ga akpachakwara anya ikọwapụta ihe anyị bu n’obi mgbe anyị na-ekwu okwu nhazigharị anyịa.

Ọ sịrị na otu n’ime okwu akpọlitere nke ya kwenyere n’ime ya bụ na steeti ọbụla ga-ejiri aka ya na-ahazi akụ n’ụba ya, ma hazikwa nchekwa ya, nkea ga-eme ka steeti ọbụla welite aka n’ịkpata ego ma megharịkwa ahụ n’ụdị inwe onwe.

Ọ sịrịṅ na ha kpara maka nchekwa ma kwere na ekwesiri ime karia ka esi eme ugbua. N’okwu ya, ndi mmadụ ga-aka nwee obi iru ala mgbe ha ji aka ha na-ahazi ihe gbasara nchekwa ha. Ọ sị na nkea butere ha ji kpaa maka steeti ọbụla inwekwa ndi uwe ojii nke ha.

Osinbajo bụ onye kwuputara na olile anya dịrị Nigeria sịrị na-ana-ebu agha megide ike ọchịchịrị n’ala anyị iji hụ na ihè chakwasara Nigeria.

Mgbe o kwuru okwu maka ụdị Nigeria anyị na-atụ anya ya, onye isi oche Penticostal Fellowoship nke Nigeria (PFN) ngalaba steeti Ọyọ, bụ nnukwu ụkọchukwu (bishop) Taiwo Adelakun gwara osote onye isi ala na ọ dị mkpa na ụmụ Nigeria kwesiri ima ka esi etinye ọnụ n’okwu gbasara ha.

Ọ sịrị na ndi ala anyị kwesịrị ima ihe gọmenti a, elere anya na ha biara imegide mpụ na aghụghọ na-eme gbasara yabụ mpụ na aghụghọ bụ nke ka na-agakwa n’ihu n-ala anyị nakwa n’ime otu ọchchị APC.

Adelakun sịrị na ha bụ ndi isi ụka akpọrọ pastor chọrọ ịma ihe gọmentia na-eme maka mpụ ahụ emere nke metutara Maina akpọrọ “Mainagate” nakwa ndi ọrụ gọmenti ndi ọzọ ana ebo ebuboo mpụ na aghụghọ.

Ọ sịrị na ọtụtụ ndi ala anyị na-ahụta mbọ ana-agba imegide mpụ na aghụghọ dika ana-eme tụrụbọm tụrụbọm. Ọ sị na ọbụ nkea mere na yabụ mbọa anaghị amịta ezigbo mkpụrụ.

Ọ sịkwara na etu agha ndị Boko Haram nakwa nke ndi nche ehi siri birikwa ọkụ n’akụkụ ala anyị dị iche iche na-awụ ndi otu Kraist akpata-oyi.

Okwuru si, na mbụ agwara ndi ala anyị, na ememilaala ndi Boko Haram, mana n’ime afọa, ndi Boko Haram egbuela ọtụtụ ndi mmadụ ma tọrọkwa ihe karịrị otu naari mmadụ na mmadụ iri abụọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.