ADEBOYE ADỌKWAALA AKA NA NTỊ ỌZỌ MEGIDE ỊCHỌ DI NA NWUNYE N’ỌBA OZI IKUKU “SOCIAL MEDIA “

Spread the love


Onye isi ụlọ ụka akpọrọ Redeemed Christian Church of God, RCCG n’aha ịchafụ, bụ Ụkọchukwu Enoch Adeboye, adọkwaala aka na ntị ọzọ megide ịnọrọ n’ọba ozi’social media’ chọọ di ma ọ bụ nwunye.

Ọ sịrị na ọ jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ, mmadụ inọrọ n’ikuku chọọ onye ọ ga-alụ, na-ebughị ụzọ tọọ ntọ-ala ihe gbasara onye ọ chọrọ ịlụ.

Adeboye gara n’ụzọ ochie wee kọwaa ka ndi nne na nna na-esi tọọrọ ụmụ ha ntọ-ala ma chọpụta ihe gbasara onye ha chọrọ ịlụ tupu na ha akwado alụm di na nwunye ha.

Ụkọchukwu ahụ gara n’ihu kwaa arịrị maka ụmụ ntorọbịa ndi nne na nna ha na-etinye aka n’ajọ ihe. Ọ sịrị na ụdị ajọ ihe ndi a na-emechaa wetara ụmụ ha nsogbu na ilaghachi azụ.

O kwuru na-ọbụ eziokwu na ndi okenye mgbe ochie agụghị akwụkwọ mana ha nwere amamihe n’uju.

Adeboye kwuru ihe ndia mgbe ha mere emume mụọ nsọ nke ọnwa anọ n’afọ a nakwa ọmụmụ-anya abalị ha n’ebe ekpere ha dị na Mowe na Ogun Steeti, n’okporo ụzọ awara awara si Legọs gawa Ibadan. Ekpere na ọmụmụ-anya haa biara na ngwụchaa n’abalị asaa nke ụbọchị Satọdee ọnwa anọ n’afọ a.

Na mmechi okwu ya, ọ sịrị, “ị nọrọ n’ama ọhaneze ikuku Facebook lọọ nwanyị, ị gaghị ama mgbe nwunye gị jiri si ama ọhaneze ikuku You Tube gbanarị gị.”

Osote onye isi ala bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo nakwa nwunye ya bụ Dolapo biara mmemme a, tinyekwara ọtụtụ ndi kwere-ekwe ndi ọzọ.

Ọ bụ n’afọ gara aga (2017) ka Adeboye buru ụzọ dọọ ndi ụka ya aka na nti ka ha ghara isi n’ikute ụtaba banye ime ahia n’ebe ha na-eme, ahụrụm gị n’anya nke ikuku.

Ọ sịrị n’udi ihe a na-ebute alụọ taa, echi agbaa alụkwaghịm

Leave a Reply

Your email address will not be published.

5 × two =