ADEBOYE ADỌKWALA AKA NA NTỊ ỌZỌ MEGIDE ỊCHỌ DI NA NWUNYE N’IKUKU

Spread the love

Onye isi ụlọ ụka akpọrọ Redeemed Christian Church of God, RCCG n’aha ịchafụ, bụ Pastor Enoch Adeboye, adọkwala aka na ntị ọzọ megide ṅịnọrọ n’ama ezụm-ezụ ọhaneze nke ikuku nwa bekee kpọrọ ‘social media’ chọọ di mọbụ nwunye.

Ọ sịrị na ọ jọgburu udele ma sigbue nkakwụ, mmadụ inọrọ n’ikuku chọọ onye ọ ga-anụ, na-ebughị ụzọ tọọ ntọ-anị ihe gbasara onye ọ chọrọ inụ.

Adeboye gara n’ụzọ ochie wee kọwaa ka ndi nne na nna na-esi tọọrọ ụmụ ha ntọ-ana ma chọpụta ọfọma ihe gbasara onye ha chọrọ inụ tupu na ha akwado anụm di na nwunye ha.

Ụkọchukwu ahụ gara n’ihu kwaa arịrị maka ụmụ ntorọbịa ndi nne na nna ha na-etinye aka n’ajọ ihe. Ọ sịrị na ụdị ajọ ihe ndia na-emechaa wetara ụmụ ha nsogbu na ilahachịi azụ.

O kwuru na-ọbụ eziokwu na ndi okenye mgbe ochie agụghị akwụkwọ mana ha nwere amamihe n’uju.

Adeboye kwuru ihe ndia mgbe ha mere emume mụọ nsọ nke ọnwa anọ n’afọa nakwa ọmụmụ-anya abalị ha n’ebe ekpere ha dị na Mowe na steeti Ogun, n’ okporo ụzọ awara awara si Legọs gawa Ibadan. Ekpere na ọmụmụ-anya haa biara na ngwụchaa n’abalị asaa nke ụbọchị Satọdee ọnwa anọ n’afọa.

Na mmechi okwu ya, ọ sịrị, “ị nọrọ n’ama ọhaneze ikuku Facebook lọọ nwanyị, ị gaghị ama mgbe nwunye gị jiri si ama ọhaneze ikuku You Tube gbanarị gị.”

Osote onye isi ala bụ Yemi Osinbajo nakwa nwunye ya bụ Dolapo biara mmemmea, tinyekwara ọtụtụ ndi kwere-ekwe ndi ọzọ.

Ọ bụ n’afọ gara aga (2017) ka Adeboye buru ụzọ dọọ ndi ụka ya aka na nti ka ha ghara isi n’ikute ụtaba banye ime ahia n’ebe ha na-eme, ahụrụm gị n’anya nke ikuku.

Ọ sịrị n’ụdị ihea na-ebute alụọ taa agbasaa echi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

sixteen − thirteen =