ỤMỤ NIGERIA BI NA UK EKWUELA NA HA ACHỌGHỊ BUHARI IZỌKWA ỌKWA ONYE ISI ALA ỌZỌ

Spread the love

Ụfọdụ n’ime ụmụ Nigeria bi na United Kingdom nọrọ na London kpọọ ganị ganị ụnyahụ bu Tusdee megide ṅmbọ onye isi ala anyị bụ Mohammadu Buhari na-agba ịlọghachite azụ dika onye isi ala n’afọ na-abịa abịa.

Ebe anọrọ kpọọ ganị-ganịa bụ nke akpọrọ Abuja House na London, bụ ebe onyi isi ala anyị na-anọ n’obodo ahụ.

Ịkpọ ganị-ganịa malitere ka o ji ihe dika awa iri abụọ na anọ gatachaa mgbe onye isi ala bụ Buhari kwuputara ebum n’obi ya iso mee ndọrọ-ndoro dika onye isi ala n’afọ na-abịa abịa.

Ụlọ ọrụ onye isi ala ekwuela na ikpọ ganị-ganịa bụ ndi ana-ama imi dịka ndi ụfọ nfọju akpa bukọrọchara ego ala anyị na-ekpokọba ya. Ọ siri na ụfọdụ n’ime ha bi n’ala anyị ebe ndi ọzọ bigasị na mba ofesi.

Ọnụ mmiri okwu anyị siri n’ụlọ ọrụ onye isi ala nweta na-ekwu na ebe ọna abụ atụọ ilu nkịrịka nkata agadi nwanyị anọgharia, n’ọbụ mbọ ahụ onye isi ala na-agba, imemila mpụ na aghụghọ n’ala anyị ka ndi nkea metutara ji akpọ ganị-ganịa. Ọ sị na ọbụ nkea mere ndi dị otua ji apịgharị aka, wee ga kpokọta ndi ọrụ ngo n’ịkpọ ganị-ganị ka ewere tigharia onye isi ala anya ma ya bata mba United Kingdom.

Onua kwuru na ọbụ ndi ụfọ nfọju akpaa bi na UK na ala anyị jikọrọ aka ọnụ na ikpọ ganị-ganịa. Ọsị na ebum n’obi ha bụ ka ewere tigharia njem ọrụ onye isi ala na-ejikere iga ka ya na aka na- achị United Kingdom bụ Theresa May nakwa ndi ọzọ wenitere isi kpaa, anya.

Ozia yọrọ ụmụ Nigeria ndi bi n’ụlọ nakwa mba ofesi tinyekwara ndị ji ego achụ egọ nakwa ndi enyi Nigeria ndi ọzọ ka ha leghara ikpọ ganị-ganịa anya.

Ọ sịrị na nkea bụ egwú anọ n’ime ọhịa etiri nwa nnụnụ iji mee ka onye isi ala ghara iga n’ihu na mbọ ọ na-agba iji kpochapụ mpụ na aghụghọ n’ala anyị bụ nke ọ kọwara dịka ihe na-amita ezigbo mkpụrụ n’ala anyị nakwa mba ofesi ugbua.

Otu ọnụ okwua na-ekwu na ganị-ganịa ka nwekwara ike bụrụ n’ihi mbọ gọmenti ji n’aka ugbua, iji kpọpụta aha ndi ụfọ nfọju akpa ala anyị ma takwa ha ahụhụ. Ọ sịrị na nkea gunyere ndi ala anyị nwechara ụlọ na UK mana ha anaghị atụ ụtụ isi ka o si kwesi ekwesi. Ọ sịrị na egwù ma-aga-ebuso ha agha site na njikọ-aka ala anyị nakwa mba ọzọga sochaa n’ihe bụtere ụdị ịkpọ ganị-ganịa.

N’isi nsoa ka gọmenti wepụtara aha, o kachakwa ndi nọ n’otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị PDP bụ ndi ekwuru na ha bukọrọ ego ala anyị mgbe ha nọ n’ọchịchị.
Ndi PDP nakwa ọtụtụ ndi nkịtị ekwenyeghị na aha ndia eweputara bụ nke ezigbo ya.

Mịnịsta ala anyị mgbasa ozi di n’aka bụ Lai Mohammed nọrọ na ụbọchị Mọnde gara aga kwue na mgbe eteghị aka, na ga-eweputakwa aha ndi ụfọ nfọju akpaa n’ụdị ga-atụ ndi mmadụ n’anya.

N’okwu nke ya, ọnụ na-ekwuru onye isi ala bụ Garba Shehu sịrị na ịkpọ ganị-ganịa agaghị etigharị onye isi ala anya na njem a ọ na-ejikere ime gawa mba United Kingdom.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

one + seventeen =