ỌGWỤGWỤ OGE: ONYE ISI ỤKA AMACHIELA ỤMỤ NWANYỊ IYI UWE ARAA NA ỌBANTE BỊA ỤKA

Spread the love

Na Kenya, otu onye isi ụka (Pastor) aha ya bụ Rev. Njohi nke ụlọ ụka Lord’s Propeller Redemption Church, dị na Dondora Phase 2, na Ọwụwa Anyanwụ Nairobi, amachiela ụmụ nwanyị na-abia ụka ahụ iyi uwe ara nakwa ọbante bịa ụka.  

N’uche ya,nke a ga- eme ka Kraist nwee ohere banye na ndụ ha.

Ọ bụ n’ime nzukọ ndi ụka ahụ nwere nke ọ bụ onye isi ụka ahụ bụkwa onye isi oche ya ka-anọrọ tie iwu a.

Dịka nwa-amadị a sịrị kwuo, iyi uwe ime, dịka nke ara nakwa ọbante esoghị na ihe Chukwu chọrọ ka-a na-eme.

Nwoke a dọrọ ndi nne ụka ahụ aka na ntị ka ha gbaa mbọ ihụ na ụmụ ha ndi nwanyị debere iwu a ma ha na-abịa ụka, ọ kachakwa n’ụbọchị ụka, ka o nyere ha ohere ịnabata Kraist.

Rev. Njohi mara ọkwa idọ aka na nti, na ntarama ahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ ga-adịrị nwanyị ọbụla jiri ụzọ nzuzo yiri ụdị uwe ndia were bịa ụka.

Dịka o siri kwuo, mgbe ndi mmadụ na-aga ụka, ha kwesiri ighebe onwe ha oghe ka ha nwee ike inabata Kraist na ndụ ha.

Otu onye n’ime ndi ụka ahụ nke na-achọghị ka akpọọ aha ya sịrị na ụmụ nwanyị ụka ahụ rubere isi nye iwu nwoke a were na-abịazị ụka na eyighị uwe ime ndia.

Leave a Reply

Your email address will not be published.