ARỤ! ANWUCHIELA OTU NWOKE N’ELU ADA YA NWANYỊ

Spread the love

Otu nwoke di afọ iri anọ n’ise ka e jidere n’anya ọcha ebe ọ na-edina ada ya nwanyị.

Enock Mweene, bụ nna mụgoro ụmụ asaa na mpaghara Southern Province nke mba Zambịya ka-e jidere n’anya ọcha n’izu ụka a mgbe ọ na-edina ada ya nwanyị. E kwuru na nwoke a bụ o mewere gboo n’ụdị akparama-agwa nkịta a.

Ọ bụ mgbe nwunye ya jidere ya ma tikwaa mkpu ka ndi mmadụ biara kụba Enọch ihe ‘tịnka kụrụ panụ’, ka nwoke a kwuru na ihe ya ji eme ụdị ihe a bụ iji jikere ụmụ ya nwanyị maka alụm di.

E kwukwara na Mazị Mweene na-akpaso ụmụaka ya ndi nwanyị atọ ụdị akparama-agwaa ihe karịgoro afọ abụọ, eri afọ puku abụọ na iri n’ise. (2015).

Otu onye n’ime ndi jiri anya ha abụọ hụ arụa sịrị na ha na-anụbu kepu kepu na nwokea na-eme ụdị ihea, mana ọbụ taa ka ha jidere onye ori ma jidekwue agụgọọ ya, mgbe ejidere nwa-amadịṅa n’elu nwa ya nwanyị nke osote isi ada.

Ọ bụ mgbe a kụwara nwoke a ihe ka-ana-anwụ anwụ ka ọ sịrị ka ya gwa ha nke bụ eziokwu, wee sị na ihe ya ji akpa agwa dị etua bụ ka ya jiri ya kwadoo ụmụaka ya maka mgbe ha ga-alụ di.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

10 + seventeen =