IHE MBEREDE OKPORO ỤZỌ!

Spread the love

Ozi anyị siri steeti Kano nweta na-ekwu na mmadụ anọ nwụrụ pịị ebe mmadụ iri na itolu nwere mmerụ ahụ n’ụdị dị iche iche; n’ihe mberede ụgbọala mere n’okporo ụzọ si Kano gawa Bauchi. Ọbụ kpọm kwem na obodo ana-kpọ Dogon Danmarke dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Wudil, na steeti Kano ka ihe mberedea mere.

Onu na-ekwuru ụlọ ọrụ steeti Kano na-ahụ maka mgbochi nakwa izọnyụ okụ ọgbụgba bụ Alahaji Saidu Mohammed sịrị na ihe mberedea mere mgbe ojiri nkeji iri anọ na anọ gata elekere iri nke ụtụtụ nke ụnyahụ bụ Faraidee, abalị iri na atọ, ọnwa anọ n’afọa. Ọ sịrị na ọbụ otu onye aha ya bụ Mazị Filip kpọrọ n’ekwe ntị ma gwa ụlọ ọrụ ha maka nkea.

Alahaji Mohammed sịrị na ha egbughị oge ọbụla izipu ndi ọrụ ha ebe ahụ mgbe ha nwetara ozia. N’okwu ya ndi ọrụ ha rutere ebe ihe mberedea ma malite inyere ndi nkea metutara aka mgbe oji nkeji iri na abụọ gatachaa elekere iri na otu nke ụtụtụ.

Ọ sịrị na ihe mbererdea metụtara ugbọala atọ n’otu nje. Ọkpọrọ aha ụgbọ ala ndia dịka Toyota Hummer nke akara ya bụ SA 297 GME; Volkswagen Golf nke akara ya bụ SSP 134 ES nakwa Volkswagen Sharon akara ya bụ SA 158 PAT.
Ọ sịrị na ọbụ igba oke ọsọ nakwa enweghị ike ijikwata ụgbọ butere ihe mberedea. Ọ gara n’ihu kwue na ọbụ mmadụ iri abụọ na atọ ka ihe mberedea metutara. Mohammed kwuru na ọbụ mgbe ebugara ndia ụlọ ọgwụ dị na Wudil ka ndi ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ nọrọ kwue na mmadụ anọ n’ime ha anwụọla ebe mmadụ iri na itolu nwere mmerụ ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

19 − 18 =