NWIKORỌBỊA AMAGBUELA ENYI YA NWANYỊ MAKA NA-ỌJỤRỤ ITEPU IME

Spread the love

Otu nwikorọbịa aha ya bụ Ismail Nasiru dị afọ iri abụọ na atọ ka-ana ebo ebuboo na ọ magburu enyi ya nwanyị aha ya bụ Salamatu Garba dị afọ iri abụọ na abụọ na steeti Jigawa.

Ọ bụ n’ọnwa atọ n’afọa bụ puku iri abụọ na iri na asatọ ka nkea mere n’ime ọhịa di n’obodo ana-akpọ Jahun n’ime okpuru ọchịchị gọmenti ime obodo Jahun. Akụkọ na-ekwu na ihe mere ede a jiri bee nwịm bụ na nwata nwagbọgọbịa a jụrụ itepu afọ ime ya digoro ọnwa anọ.

Anwụchiri nwa-amadia bụ Nasiru mgbe ewegara mkpesa ihe na-aga n’aka ndi uwe ojii dị n’obodo ahụ, ka ahụrụ ozu nke nwanyị n’ime ọhịa.

Onye ji ọkwa kọmishọna ndi uwe ojii na steeti ahụ bụ Mazị Bala Zama Senchi, mgbe ọ na-ekwu na akụkọa bụ nke mere eme, sịrị na-ebugala ozu nwagbọgọbịa n’ọba ozu dị n’ụlọ ọgwụ Jahun, bụ ebe aga-echekwa ganye na-atọchaa ntọ anị ma mara ka miri siri baa n’opi ụgbọgọrọ.

Ọ sịrị na site n’ihe ọgbụgba-ama ndi uwe ojii nwetara, ka ndi ọbụ ọrụ ha ịma imi n’ala gbasara ogbugbu ọchụ jiri mata maka ibụ enyi ụmụ ntorọbịa nabọa. O sịrị n’ọbụ nkea mere ha jiri gaa ma nwuchie nwa-amadia ana ebo ebuboo.

Ọ sịkwara na-ewegala mkpesaa n’aka ndi na-ama imi n’ala ichọpụta onye mere ihe ọjọọ nke isi ụlọ ọrụ ndi uwe ojii steeti ahụ di na Dutse bụ isi ọbodo steeti Jigawa.

Mgbe agbara nwa-amadịa bụ Nasiru ajụjụ ọnụ, ọ kwere na ọ bụ ya gburu nwata nwanyịa. Nasiru nọ n’afọ nke abụọ n’ụlọ akwụkwọ ukwu bụ Ringim Polytechnic.

Ọ sịrị na Salamatu bụ enyi ya nwanyị. O kwukwara na ha na-enwe mmekọ nwoke na nwanyị. Nwokea bụ Nasiru kwuru na mgbe ya chọpụtara na nke nwanyị dị ime, na ya gwara ya ka-otepu ime ahụ mana ọ kpọchiri ntị ganye na afọ ime ahụ abanye ọnwa anọ. Ọ sịrị na ya kpọgara ya ụlọ ọgwụ, ebe ndi ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ jụrụ itepu ime ahụ. O kwuru si n’ọbụ nkea mere ya ji buga nwata nwanyịa ime ọhịa ma were mma ọdị-n’akpa ya wee magbue ya.

Nasiru kwuru hooh-haa, na ndi uwe ojii bịara nnyocha n’ụlọ ya, na ha nwetara ịchafụ nke nwanyị n’ụlọ ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

7 + thirteen =