OBI MGBAWA! NWATA NWANYỊ AHỤLA OZU ỤMỤ YA ABỤỌ N’IME NTỤOYI (FREEZER)

Spread the love

Ọbụ nnukwu ihe mgbawa obi na nne nwanyị gachara ihe lọta, wee hụ ozu ụmụaka ya nabọ ọ hapụrụ pụọ ka ha dọọrọ n’ime ntụ oyi (deep freezer).

N’ụlọ akara ya bụ No. 6, Road 1 Eyin Ala, di n’Akure na steeti Ondo ka nnukwu ihe nhuju anyaa mere ka ọnwa anyị nọ n’ ime ya dị n’abalị iri na abụọ.

Mgbe nne ụmụaka nabọa aha ha bụ Olufemitan Olaitan dị afọ itolu nakwa Oluwafumi Olaitan dị afọ asaa ma bụrụkwa ndi ka nọ n’ulọ akwụkwọ nta hapụrụ ha na-apụ, ha na-egwuri egwu. Mana mgbe nwanyịa, aha ya bụ Oriakụ Olubunmi Olaitan lọtara, ebe ọ hụzịrị ụmụ ya bụ n’ime ntụoyi anaghị arụ ọrụ ka ha dọrọ n’ozu.

Onye na-ahụ maka mmekọrita ọhaneze na ndi uwe ojii steeti ahụ bụ Mazị Femi Joseph kwuru hoohaa, na nkea bụ ihe mere eme. Ọ sịrị na nkea bụ nnukwu ihe nwute na-agbawa obi.

Mazị Femi sịrị na onweghị onye ana-ama ime maka nnukwu ihe ọghọm a maka na ọ dị ka ụmụaka nabọa na-egwuri egwu n’ime ntụoyia, o wee mechibido ha n’iké mgbe onweghị onye nọ nso maka imepere ha ntụoyia.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

two × four =