TỤFỊAKWA!!! ỌKARA MMADỤ ỌKARA ANỤMANỤ NA-AKPA IKE NA MBA AJENTINA

Spread the love

Ụjọ na akpa ji ndi mmadụ na mba Ajentina. Ihe butere nkea bụ na enwere ihe enweghị ike ikpọ mmadụ nke eji akpọchaa anụmanụ nke pụtara ma na-atagbusị ụmụ mmadụ nakwa ụmụ anụmanụ na mba ahụ.

Akụkọ anyị nwetara na-ekwu na ọbụ n’obodo akpọrọ Santa Fe n’Ajentina ka ahụrụ ihea na nso nsoa.

Ka-aka kpụ okwu n’ọnụ, ajọ ihea atagbuela nnekwụ nkịta nabọ ma were anya ọkụ na-achọkwa ihe mọbụ onye ọzọ ọ ga-atagbu.

Esetere ihe onyonyoo ya na foto ka-ona-akpa ike. Ụfọdụ n’ime ndi ji anya ha hụ ya sịrị na o yiri anynịnya ibụ onu ogologo (camel), maka onu ogologo ya nakwa nwa ntọntọ isi ya, ebe onwere ụkwụ yiri nke mmadụ.

Inwere ike kirie ihea na onyonyoo-okwu bụ vido n’ọba onyinyoo okwu you Tube. Ebe ị ga-achọ nkea bụ n’akụkụ UFOmania.

Otu n’ime ndi lelegoro onyonyooa kwuru na ya ahụtụnugo ụdị ihea na mbụ, n’ime afọ puku abụọ na ise mgbe ọ na-agafe akwa mmiri. Ọ sịrị na mgbe abụghị-mmadụ-abụghị-anụmanụ a hụrụ ha, na o lere ha anya dị egwu ma gawakwara onwe ya, na-aga ka anụmụnụ ahụ ana-akpọ kaankaloo (kangaroo).

Onye nke siri mba Filipin hụ onyonyooa sịrị na ha na-akpọ ya ASWANG nke pụtara mmadụ mere onwe anụmanụ. Ọ sịrị na ọbụ ekwensu nke nwere ike ịghọ nwamba mọbụ nnukwu nnụnụ mọbụ anụ ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.