NNUKWU ỌKWA DỊ MKPA MAKA NDỤ GỊ!!!

Spread the love

AZỤKWANA ANỤ AHỤ IJIJI EBEGHỊ N’ELU!!!

Owere ewu na ọkụkọ anya na ọkụ latrik na-abịazịrị anyị dịka ọbịa pụrụ iche. Maka nkea, ndi na-ere anụ ahụzịghị ọkụ ha ji-echekwa anụ ha refọrọ na ntụoyi.

N’ihi ya ụfọdụ ndi isi agbọ ncha n’ime ha ka-ekwuru na jizi ọgwụ ahụ eji echekwa ozu mmadụ n’ọba ozu ana-akpọ FORMALIN echekwazị anụ ana-eri eri.

Otu ihe pụrụ iche eji mara bụ na ijiji anaghị ebe na ihe awụrụ yabụ ọgwụ.

Ndi ọka mmụta mara ihe gbasara nkea ekwuela na erie ihe awụrụ yabụ formalin, na ọ na-aga mebie imeju onye riri ya. Nkea na-ebute ọnwụ.

Ya ka eji ama ya ọ bụrụ ọkwa, biko doo doo doo, ị bịa ibete anụ ma chopụta na ijiji anaghị abịa nso n’anụ ahụ ma ya fọzịkwa nke ibekwasị ya n’elu, gbaara anụ ahụ ọsọ.

Ụkpara okpoko buru, ntị chikwara ya. Nye aka zisaara ndi ọzọ ozia. Nye aka chekwaa ndụ nwa nne gị

Leave a Reply

Your email address will not be published.