MASSOB EKWUELA OKWU MAKA MKPỌ IKIKERE NDI ỤLỌ OMEBE IWU EBUURU N’IKÉ

Spread the love

Ndi na-agba mbọ maka Biafra inwere onwe ha, akpọrọ Movement for Actualization of the Sovereign State of Biafra, MASSOB n’aha nkenke, nke ọ bụ Uchenna Madụ nọ n’isi ụgbọ ya, nọrọ na Wenesdee gara aga kwue na ka-esi were ike buru mkpọ-ikikere ndi ụlọ omebe iwu ala anyị ngalaba nke sineti egosila na Naijiriya adaala n’ụdị enweghị nkuli ọzọ.

Ndia chọrọ ka-ekewapụta mba Biafra gosiri mgbagwoju anya ha ka ndi amakekwu siri nwee ohere banye n’ụlọ ndi omebe iwua n’iké. N’okwu ha, ndi nchekwa dị n’aka tosiri ịnọ na nche ma mụrụ anya mgbe niile n’ebe ahụ.

N’okwu nke onye na-ahụ maka mgbasa ozi ndi otu MASSOB, bụ Mazị Edeson Samuel, ọ sịrị na inapụ ndi omebe iwu Naijiriya mkpọ-ikikere ha gosiri na yabụ mba adaala. Ọ kpọkụrụ ndi omebe iwu niile nọ na sineti ka ha jiri nwayọọ lọhachi na mpaghara dị iche iche ha na-anọchite anya ha. Ọ sịrị na ọ dị mkpa na onye bịara ibe ugwu ga-ana ebe ọ bụ na nwa anwụọla.

Ọ gara n’ihu kwue na nkea gosiri na ike agwụla ọchịchị onye isi ala bụ Buhari, ma ọbụrụ na ndi amakekwu nwere ike iba n’ụlọ ndi omebe iwu ma buru mkpọ ikikere ha na-enweghị ka ndi nchekwa obodo dị n’aka si sị ha unu amakwa ndi anyị bụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

12 − three =