EGWU DỊ N’ABUJA!!!

Spread the love

Egwu ji ndi nọ n’ime Abuja ugbua maka ngagharị nke ndi ụka Alakụba ngalaba nke akpọrọ shiite chọrọ ime iji gosi na ha chọrọ ka-ahapụ onye isi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky na nwunye ya eji eji.

Malite ụnyahụ bụ Tọsdee ka-ebidoro na-ezipu ozi n’ọba ozi dị iche iche dika Whatsapp, facebook nakwa ndi ọzọ iji dọọ ndi mmadụ aka na nti maka ịchara ha n’ụzọ ebe atụrụ anya na ha ga-esi gafee n’oge ngagharị iwe ha a tata bụ Faraidee tụmadịkwa n’oge ha ji ekpe ekpere ha.

Ana ele anya na ebe bụ ebum n’obi ha ime ngaghari iwe ha bụ isi ụlọ ekpere ha dị na-ebe akpọrọ Area 11 nakwa ụlọ ekpere nke ndi Alakuba ndi Yoruba di na Wuse 2 Abuja.

Oteela ndi otua malitere na-eme ngaghari iwe n’obere obere iji kwu ka-ahapụrụ ha onye isi ha eji eji.

Ụbọchị ụka gara aga ka ndi otua nuputara n’igwe n’ime Abụja n’ụzọ gbagwoburu ndi nchekwa obodo dị n’aka anya.

Nkea mere eji kpọkue ndi agha na ndi ọzọ ọrụ nchekwa dị n’aka ka ha gbata nyere ndi uwe ojii aka.

Leave a Reply

Your email address will not be published.