ENWERE IKE AGAGHỊ AKWỤGBU EMEKA EZEUGO

Spread the love


Gọmenti steeti Legọs ekwuela na enwere ike ghara ịkwụgbu Rev. Chukwuemeka Ezeugo bụ onye eji Rev. King wee mara.

Obụ onye ji ọkwa kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ bụ Adeniji Kazeem kwuru nkea.

Ọbụ mgbe ọna-agwa ndi nta akụkọ okwu kwa afọ, nke puku abụọ na iri na asatọ nke ụlọ ọrụ ahụ ji echeta agba afọ atọ nke aka na-achị steeti ahụ bụ Akinwunmi Ambode ka kọmishọna a kwuru nkea.

Ọ si, na ọbụ eziokwu na ihe gbasara Ezeugo bụ okwu welitere isi mana ekwuchakwa elu kwue ala na Emeka so na ndi na-eche nkwugbu site n’ikpe nke ụlọ ikpe màrà ya.

Ọ sịrị na ọ bụrụ na nwokea anọgide n’ụlọ nga rue mgbe ihe dị abụọ, ofu ga-eme, akwụgbue ya.

Ọ gara n’ihu kwue sị, mana ọ bụrụ na-elechara anya hụ na nwokea kwesịrị imere ebere, aga-emere ya ebere, mana ọ sịkwara na-erubeghị ebe ahụ kịta. Yabụ na, isi ga na-ejigodu ya oyi ebe ahụ.

Anyị ga-echeta na-amara nwokea bụ Emeka Ezugo ikpe ọnwụ n’oge gara aga maka ụdị ọchịchị aka ike nakwa tigbue zọgbue oji achị ma na-egbu ndi ụka ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

5 × four =