18 Comments

  1. 1. Nwanyị na ere ogiri mara ijiji anya kpọrọ.

    2. Anaghị eji ose aga ebe ans-agwọ anya odo.

    3. Anya bewe imi ebewe.

    4. Anya na-ebu ọnụ ụzọ eri.

    5. Anya kpọrọ akpọ bara n’okpokoro isi.

    6. Onye nwanne ya amaghị egwu agba, ọkọ iku anya na-akọ ya.

    7. Ihe ọkụkụ ji añụ mmiri eleli anya elu bụ na ọnwụ na-egbu ya si n’elu abia.

    8. Nkita riri ụtara rie ji ma na-elilikwa anya elu, ọ chọrọ ka enye ya ụtaba?

    9. Ihe ọma na anya gbara ndụ.

    10. Anya ka-eji ama ọka chara acha.




    0



    0
  2. 11. Anya ka ụmụ nne ji agwa onwe ha okwu na mba.

    12. Otu anya ka eji alụ nwanyị.

    13. Agwọ sị na-ewepụ mkpụrụ anya ya ụmụ nwanyị ejiri ya kee nkụ.

    14. Onye chọrọ ima ka ihe yara nne atanị ha ya lee ya anya na mkpụrụ anya oji fụọrọ ya ọkụ.

    15. Elewe okenye anya n’ọnụ, ọ dị ka ojighị ya wee nụọ araa.

    16. Elewe agadi nwanyị anya, ọdị ka ejigh ego wee lụọ ya.

    17. Nwata tulie nna ya elu mkpụrụ amụ nna ya ayọpịa ya anya.

    18. Otu mkpụrụ anya ji isi ụgwọ.




    0



    0
  3. 19. Enye nwata ihe karịrị anya ya, ọ jụọ asị sị nye ya onye.

    20. Nwanyị ji irọ anya aja di ya mma.

    21. Ọkwa si na ihe ha ji adị abụọ aga bụ anya ahụghị, anya ahụ.

    22. Enwe sị na-ewepụ na chi ya mụ anya iku anya emebie mma ya.

    23. Nke mụ hụrụ n’anya bụ eziokwu ma nke mụ nụrụ na ntị bụ asị.

    24. Ejighị abalị arọ anya.

    25. Elewe ikpere anya atọọ n’isa ahụ.

    26. Anya nwoke ji ahụ akwụna n’abalị abụghị nke o ji ahụ ya n’ụtụtụ




    0



    0
  4. Otu Anya ji isi ugwo.
    Okenye ma Anya e lere ele na nke a roro aro.
    Anya na ihe di mma gbara akwukwo.
    Mmiri anaghi ama ehi n’anya.
    Anya okuko’ na-eche akwa ya.




    0



    0
    1. Author

      ỌGBỤGBA OKWE: SAỊ NWENYA, 38 NGỌZỊ NWARỤNTA 3, DỌKỊNTA ACHỤKỌ 29,

      SAỊ NWENYA eturuwo ugo




      0



      0
  5. 1. Nwa sị na nne ya agahị arahụ ụra, ụra agahị adị ya na anya.
    2. Ebe nwata n’ele anya atụ aka, nne ha anọghị ya, nna ya anọrọ ya.
    3. Ji kwụrụ akwụ amaghị anya mbazụ n’ele ya
    4. Ụzụ na-amaghị akpụ ogene, lee egbe anya n’ọdụ.
    5. Ọkụkụ sị na ihe ya ji ele anya n’elu ma ya na añụ mmiri bu na ihe n’egbu ya si n’igwe abịa.
    6. Elewe okenye anya n’ọnụ, ọdịka ojighị ya ñụọ ara.
    7. Nwata bulie nna ya elu, akpa amụ ya ayọchie ya anya.
    8. Onweghị ihe anya hụrụ gbaa ọbara.
    9. Nshịkọ sị na ya gwuru mmiri ukwu, gwukwa mmiri nta ma ite agadị nwanyị sụkpọrọ ya anya.
    10. Agadị nwanyị nwere onye n’elekọta ya anya sị na agbụrụ ya na aka nka.
    11. Ụkwụ n’aga wam wam, anya n’ele zam zam n’ahụ ya.
    12. Ọkụkụ n’aga wara wara, anya n’aga wara wara n’ahụ ya.
    13. Nwanyị n’ete ofe ogiri mara ijiji anya mpịa.
    14. Onye otu anya n’abụ eze n’ala ndi ísì.
    15. Ka ahụ n’anya mere mgbọ ji tụọ enwe n’isi.
    16. Okwu ana asọ anya anaghị ebi gboo.
    17. Atụrụ sị onweghị ihe dị ụtọ ka ile anya.
    18. Anya elere mbụ amaghị ele.
    19. Ana eji anya okenye ama ihe dị n’akpa.
    21. Ana eji anya ama ọka kara akq.
    22. Anaghị eji ihe ana agba na ntị agba na anya.
    23. Anya bewe, imi ebewe.




    0



    0
  6. 24. Otu mkpụrụ anya ji isi ụgwọ




    0



    0
  7. 20.  Anaghị ahapụ ihe di n’anya eku ụra.

    21. Onweghị ihe ụra mere anya.

    22. Ọgbọ onye wụọ ngige anya atọ ya n’ngige.

    23. Ejighi anya ọma aza nnọrọm ele ụwa.

    24. Nwata rie ihe ọ na-amụrụ anya ụra atụwa ya.

    25. Okwu ana-ekwu asọ anya anaghị anwụ ọsịsọ.

    26. Asọọ eze ndi mụọ anya, ogbue eze ndi mmadụ.

    27. Ana-ama anya ukwu nwata site n’igụta ọkụ.

    28. Ọnwụ gburu nne oke ekweghị ụmụ ya saa anya.




    0



    0
  8. 29. Onweghị ihe anya hụrụ gbawa ọbara.

    30. Osisi ana ele anya ọdịda anaghị ada ọsịsọ.

    31. Okenye nwere anya oji ahụ ihe dị n’ime akpa.

    32. Ihe okenya tukwu ala hụ, nwata kwụrụ ọtọ anya ya agaghị eru ya.




    0



    0
  9. 25. Nne ewu n’ata agbara, ụmụ ya ana ele ya anya n’ọnụ.
    26. Anya n’achọ nke ya.
    27. Asọkata eze anya, ekpuru ekete/nkata n’ihu gwa ya okwu.
    28. Asọkata anya, asọpịa anya.
    29. Anya kpọrọ akpọ alaghị n’iyi n’ihi na ọ ka dịkwa n’isi




    0



    0
  10. 33. Ihe anya hụrụ ka ọnụ na-ekwu.

    34. Anya hụrụ ugo jaa ugo mma, anaghị ahu ugo kwa daa.




    0



    0
  11. 30. Ọbụrụ na nwadibịa akpachaghị anya oge ọ na-achọ ihe dị n’elu, ọ dabaa na olulu dị n’ala.
    31. Leruo anya ala maka ọgwụ adịghị akpọ n’anya




    0



    0
  12. 35. Nwata na-achọ nke ya ọ dị ka onwere anya ukwu.

    36. Ịrọ anya anaghị egbu dike




    0



    0
  13. 37. Onye sị na m lere ya ajọ anya oji gịnị hụ m?




    0



    0
  14. 38. Anya ka akọ nabọ ji eke ihe di atọ




    0



    0
  15. 32. Otule sị na ya ahụsiela anya maka agbata obi ya na ọtụ gbara.
    33. Ana asọ nwanyị otule ukwu anya, ọ bụ ya g’ara onwe ya.
    34. Ọhụrụ sị na ya ahụghị, anya kpọọ ya…..




    0



    0
  16. 35. Agaghịm anọ na mmiri,ncha abaa n’anya
    36. Eze nwere anya buru ibu abụghị eze anya mbụ.
    37. Okenye n’eji anya eke nri dị n’ime ite.
    38. Anya n’eri oke




    0



    0
  17. 39. Buru ụzọ wepụ ihe dị gị n’anya tupu iwepụ ihe dị onye ọzọ n’anya.
    40. Ọhịa nwata n’ebute eju, ka anya ya n’adị.
    41. Ana achọ anya anụ n’isi anụ.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

one × three =