ỊKWỤSỊ INA NDI MMADỤ ỤGWỌ ỌKỤ N’ỤDỊ ECHERE N’ỌBỤ GA-EBUTE NSOGBU

Spread the love

Kọmishọn na-ahụ maka ike nakwa inata ụgwọ ọkụ latrik nke ala anyị bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission, NERC n’aha ichafụ, adọọla aka na ntị, kwue na nsogbu ga-adapụta n’ihe gbasara ọkụ latrik ma ọbụrụ na ndi omebe iwu ala anyị ekwekọrịta imechi inye ndị enweghị mita latrik ụgwọ ọkụ

N’okwu nke NERC, iwu gbasara etu aga-esi nye ndi enweghị mita ụgwọ ọkụ dibu adị. Ha kwuru na iga n’ihu weputa iwu ọhụrụ gbasra inye ụdị ndia ụgwọ ọkụ ga-ebute ọgbaghara n’ebe ndi na-enyegasị ọkụ n’ala anyị nọ.

Mgbe ha na-eleba anya na mbọ ahụ ndi omebe iwu na-agba ikwụsị inye ndi enweghị mita ọkụ, n’ime mkparịta ụbụbọ nke ụlọ ọrụ Nextier Power kpokọbara n’Abụja nafọa, ka onye na-ahụ maka nchịkwata nakwa ọrụ bụ Nathan Shatti kwuru na ụlọ ọrụ NERC ahụla onye omebe iwu kpọlitere okwua n’ụlọ omebe iwu ma gwa ya na ozibeghị ezi iti ụdị iwua n’ala anyị kịta.

Na isi nsoa ka ụlọ omebe iwu ngalaba nke nnọchite anya malitere tinyewe ọnụ n’okwu maka ikwụsị inye ndi mmadụ ụgwọ ọkụ n’ụdị ihe echere n’ọbụ. Ọbụ onye ndu n’ụlọ nnọchite anya bụ Femi Gbajabiamila kpọlitere okwua.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

5 + 4 =