BUHARI EKWUELA IHE EJIRI GBUE NDI ỤKỌCHUKWU NA STEETI BENUE ỤNYAHỤ

Spread the love


Onye isi ala bụ Muhammadu Buhari ekwuela na ihe kpatara eji gbue ụkọchukwu mmadụ nabọ tinyekwara ndi ụka ndi ọzọ ụnyahụ na steeti Benue bụ ka-ewere mụnye ọkụ nke ọgụ n’etiti ndi okpukpere na ibe ha nke ga-ebute ikwafu obara ndi mmadụ.

N’ozi o zipụrụ n’ibe akwụkwọ ozi twita ya ụnyahụ bụ Tusudee, Buhari sịrị, “ejim obim niile eti gọmenti nakwa ụmụ afọ steeti Benue aka n’obi”. O kwukwara na ya na-etikwa ndi Mbalom, Bishọp, ndi ụkọchukwu nakwa ndi ụlọ ụka Katọlik nke St. Ignatius bụ ebe nkpankpaa kpara ụnyahụ aka n’obi.

Buhari sịrị na arụ nkea mere, bụ nke a nọrọ gbue ndi mmadụ biara ikpere Chukwu ha n’efụ jọgburu udele ma sigbue nkakwu n’isi. Ọ sịrị na nkea abụghị sọsọ na ekwensu biara ọrụ kama na ebum n’obi ekwensu bụ ka ọ mụnye ọkụ nke ọgụ n’ etiti mba n’ibe ya bụ nke nwere ike malite ọgụ nkwafụ ọbara agaghị akwụsinwu akwụsị

Leave a Reply

Your email address will not be published.

16 + 18 =