Nollywood na INEC ejikọọla aka ịgbasa ozi maka PVC

Spread the love

Enugwu: Otu a kpọrọ NOLLYWOOD ON PVC DRIVE  bụ otu ndi na-emebe ihe nkiri(actors/actresses) ndi weputara onwe ha ịgagharị gbasaa ozi maka mkpa ọ dị na ọhaneze nwetara akwụkwọ ime nhọpụta bụ Permanent Voters Card (PVC).

hoo!haa!! gbara onyeisi otu a bụ Agbọmma Chiege Alisigwe ajụjụọnụ.

Ndi otu ya so ya were bịa ọgbakọ mkparita ụka ọhaneze nke ụlọọrụ ala anyị na-achịkọba ime nhọpụta bụ INEC nwere ụnyahụ n’Enugwu gụnyere Mazị Aatọ Bengil, Mazị Stan K, Nwa-ada Duogad nakwa Mazị Stiv Ebo.

Agbọmma Chiege Alisigwe kọwara na n’agbanyeghi na ha anaghị enwe ohere chaa chaa, na ndi otu a weputara onwe ha inyere INEC aka were gbasaa ozi banyere onye ọbụla inweta PVC nke ya n’ihi na ha hụtara na ihe amaghịkwa kwụrụ n’ala anyị. Ha kwenyekwara na ọ bụ PVC bụ ikike onye ọbụla bụ ezigbo nwa amala nwere iji were họpụta ndi ga-eme ka ihe dịkwa mma.

Ọ kọwakwara na ha ga-eburu ozi ha gaa n’ahịa Ọgbete, ahịa ndi ọzọ dị n’Enugwu Steeti nakwazi n’ime obodo.

Leave a Reply

Your email address will not be published.