NNUKWU IHE IHERE! NDI ASHAWO NA-AZỌ ONYE PASTỌ BỤ ENYI YA NWOKE!!!

Spread the love

N’isi nsoa ka ndi mmadụ ji anya ha gbara onwe ha ekeresimesi ebe ndi akwụnakwụna chọrọ itigbu onye kpọrọ onwe ya pastọ maka na-ọhapụrụ enyi ya nwanyị gakwuru onye ọzọ. Nkea mere na Kalaba bụ isi obodo steeti Cross River.

Dika onye nta akụkọ anyị siri kwue, nwokea aha ya bụ Pastọr Effiong bụ onye ejiri igakwuru ndi akwụnakwụna wee mara na-agbanyeghị na ọ na-akpọ onwe ya “man of God”.

Mgbe nwokea buru akwukwọ nsọ ya banye n’akụkụ nke ndi ashawo, n’ime ụlọ oriri n’ọñụñụ dị n’ebe ahụ, n’ogbe ana-akpọ Watt, ọ chọpụtara na enyi ya nwanyị na nwoke ọzọ nọ. N’ihi nkea, ọ chere na ọbụ mgbe niile ka-eji ọsịsọ emeghara ọdachi, o wee kwue n’uche ya, na ya-agaghị echere ka onye bu ya ụzọ malite ọrụ gbasaa ọrụ tupu ya amalite nke ya. N’ihi nkea ka “man of God” jiri bakwuru onye ashawo ọzọ.

Ebe nsogbu malitere pastọ bụ, ka ọ ka nọ n’ọrụ ka enyi ya nwanyi pụtara, ndi otu ya wee gwa ya ihe na-aga. Nke nwanyị egbughị oge ọbụla were wakpo pastọ na onye otu ya nke ọzọ. Ọgụ were biri ọkụ n’etiti ndi ashawo nabọ ndia na-azọ pastọ. Mgbe ụmụ nwanyị nabọa na-alụ ọgụ, ndi ashawo ndi ọzọ pụtara were jidezia pastor Effiong, tie ya eti eti. Ebe asị na ọdịka-ọdị kpọwa, ọdịka-ọdị azụrụ, ụmụ nwoke ndi ọzọ bịara ihe pastọ biara nyere aka wee zọpụta ndụ pastọ, ebe ndi ashawo ahụ na-akpọ ya ọtụtụ aha ihere dị iche iche.

Leave a Reply

Your email address will not be published.