NWUNYE M MABIGARA MMA OKE, AGAM ACHỤPỤ YA – Ihe otu nwoke gwara ụlọ ikpe

Spread the love

Na mba Zimbabwe, ka otu nwoke jiri obi mgbawa hapụ ulọ ikpe ka ọ biara mechaa mkpesa na nwunye ya mara mma na-anaghị ekwe ya rahụ ụra n’abalị. Ọ sịrị na nwunye ya, nke aha ya bụ Hilda Mleya dị afọ iri atọ mara nkịrịka mma nke na-eme ya ịmụ anya n’ime abalị niile.

Ọbụ n’ụlọ ikpe nke Ichie Chireya nọ n’isi ya na obodo akpọrọ Gokwe na Zimbabwe ka nwokea mere mkpesaa.

Nwokea nke aha ya bụ Arnold Masuka dị afọ iri anọ jiri onu na-emeru obi ma na-agbakwa anya mmiri wee mesara Ichie Chireya mkpesaa.

Ọnọdụ nwokea nọ n’ime ya na-enyezị ya nsogbu, ebe ọbụ na egwu ma ndi mmadụ aga-anara ya nwunye ọma ya ma ya hapụ ya pụba, anaghị ekwezi ya jee ọrụ ọbụla.

Onye isi ụlọ ikpea bụ Ichie Chireya jụrụ Arnold ma ihe ọ na-ekwu osikwa ya n’obi ka eji ọgwụ tigharia ya anya ka ọhapụ nwunye ya na ụmụaka ya ka pechara mpe. Ọ gbakwara mbọ ịriọ ha ka ha gaa n’ihu ibi dịka di na nwunye, mana Arnold bụ onye mere ka amata, na ákwá dara n’ala akụrisigo kwuru hoohaa na alụm di na nwunye ya na Hilda biararịị na ngwụchaa tupu eweta okwua n’ụlọ ikpe

Leave a Reply

Your email address will not be published.