EGBUKWALA ỤKỌCHUKWU ỌZỌ

Spread the love

Otu ụkọchukwu amara ama ka o si ekwutọ ndi mmadụ igwuputa akụ na ụba nke ime ala na-enweghị ikikere (anti mining advocacy) na mba Filipin, ka anyị nụrụ na-agbagbuela.

Agbagburu Rev. Fr. Mark Ventura ụnyahụ bụ ụka, mgbe ọ gbasara ụka, na-agọzi ụmụaka. Agbara ya ọnụ egbe nabọ n’azụ n’obodo ana-akpọ Gattaran, province nke Cagayan, di naari kilomita atọ na iri itolu na isii nke mgbago ugwu Manila.

Fr. Ventura dị afọ iri atọ na asaa, gbasara ụka, na-agọzi ụmụaka, ya na ndi ukwe ya na-akparịtakwa nkata mgbe o jiri kwudi ọnwụ ya.

Akụkọ kwuru na onye gbara ụkọchukwua egbe jiri okpu igwe kpuchie isi ya ma were ọgba timtim ya rachapụ ọsọ, tinyekwara onye otu ya ọzọ o bu n’ọgba timtim ya.

Obụ onye isi ọrụ uwe ojii aha ya bụ Rodel Tabulog gbara ama okwu ndia.

Ndi bishọp ụka Katọlik mba Filipin akatọọla ogbugbu egburu fr. Mark.

Onye isi otu ndi bishọp mba Filipin bụ Achịbishọp Romulo Vallles sịrị “anyị katọrọ ụdị ajọ akparama agwaa”, ọ sịkwara na ha chọrọ ka ndi ọchịchị mba ahụ gbaa mbọ ma chọpụta ndi mere ajọ ihea, ma takwa ha ahụhụ kwesịrị ihe ha mere.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

16 − 15 =