EGWU DỊKWA! ỤKỌCHUKWU JIRI ANYA YA HỤ ỌNWỤ, MANA…

Spread the love

Otu ụkọchukwu ndi ụka Katọlik bụ Rev. Fr. Dọkịnta Kevin Ugoamadị, ka ndi okote-oburu, oji isi aghọ mgbọ wakporo ọgụ n’ụlọ ụka ụbọchị ụka gara aga. Ọbụ fr. Kevin bụ onye isi ụlọ ụka Sacred Heart of Jesus Parish Akwakuma na mgbago ugwu ọchịchị ime obodo Owerri na steeti Imo.

Ebusoro ụkọchukwua ogụ mgbe ọ kọwachara maka otu nwa-amadị aha ya bụ Mazị Solomon Ohakosim na-akpagharị dika ụkọchukwu ma na-anakọ ndi mmadụ ego, na-emekwa ọgbaghara, ebe enweghị ụkọchukwu ọbụ.

Mazị Solomon nke ejiri ‘Monsignor’ were mara ka ekwuru na ọ nọ ọrụ o dunyere onwe ya n’Akwakuma, bụ onye Okporo Ọlụ nke steeti Imo. Nchọpụta ndi ụka mere na egosi na-onweghịrịị mgbe ejiri mụọ nwokea bụ Solomọn dịka onye ụka Katọlik ma ya fọzikwa ya nke ichi fada. Ọbụ mgbe fada Kevin Kọwachara maka nwokea ka ụmụ ikorọbịa ụfọdụ jiri wakpo ya ọgụ, ka ọ gbasara ụka, mana Chukwu nyere aka, ndi ụka were ike zọpụ ma zopu ya.

Ka nkea na eme, otu onye ụlọ ụka ahụ bụ onye ọrụ uwe ojii kpọkuru ndi otu ya bụ ndi egbughị oge na-inye aka were wetekwa obi ida jụụ n’ụlọ ụka ahụ.

Mgbe ndi nta akụkọ gbara ụkọchukwua ajụjụ ọnụ, ọ sịrị n’ezie n’ezie, na-awakporo ya ọgụ mbge ya na-ekwu okwu mana aga na-ekwurịrị nke bụ eziokwu. Ọ sịkwara na enwelarị onye kpọrọ ya n’ekwe ntị n’abalị ụbọchị ụka ma na-eyi ya egwu maka ndụ ya. Ndi ọzọ n’ụlọ ụka ahụ kwukwsra otu ihe ahụ.

Nchọpụta gosikwara na nwa-amadịa bụ Mazị Solomọn agaala ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti Imo dịka Amatta, Akabọ nke Ikeduru, Ideatọ mgbagọ na mgbada nakwa akụkụ ebe ndi ọzọ bụ ebe ona-akọwa onwe ya dịka ụkọchukwu.

Ejikwa oherea akpọku ọhaneze, ka ha were ire ha na-agụ eze ha ọnụ mgbe ha na-alabata ndi kpọrọ ọnwe ha ndi ọrụ nke Chukwu. Ihe ejiri mara Chukwu bụ udo ọbụghị ọgbaghara!

Leave a Reply

Your email address will not be published.

ten + 5 =