POPE EKWUELA OKWU GBASARA IHE NA-EME NA STEETI BENUE

Spread the love

Pope Francis akatọọla ogbugbu ahụ egburu ndi ụkọchukwu na steeti Benue.

N’ụbọchị ụka gara aga ka Pope Francis nọrọ n’ogige St. Peter’s Square dị na Rome kwue okwu megide nwakpo awakporo ndi ụka ma gbukwa mmadụ iri na asaa tinyekwara ndi ụkọchukwu abụọ.

Pope kpere ekpere maka udo na ebe ndi ụka Kraist na Naijiriya nọ.

Anyị ga-echeta n’ọbụ n’ụbọchị Tusdee gara aga ka ndi nchị ehi wakporo ma gbue ndi ụkọchukwu mmadụ abụọ nakwa ndi ụka dị iri na asaa n’ọnụ ọgụgụ, ndi nchị ehia gbakwara ọtụtụ ụlọ ndi mmadụ ọkụ, n’okpuru ọchịchị ime obodo ọwụwa anyanwụ Gwer nke steeti Benue.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

3 + 9 =