BUHARI ATỤKWALA OGBUNIGWE ỌZỌ

Spread the love

N’izu ole m’ole gara aga ka onye isi ala bụ Muhammadu Buhari nọrọ na Lọndọn kwue na ụmụ ntorọbia ndi ala anyị bụ ndi ume ngwụ.

Okwua onye isi ala kwuru mgbe ọ gara nzukọ ndi mba Common Wealth na Lọndọn ka ọnwa anọ n’afọa dị n’abalị iri na asatọ tara ụmụ ntorọbia ala anyị arụ na ntị.

Mana ka obi ụmụ ntorọbia na-ajụnata oyi, onye isi ala gara mba America bụ ebe ọ nọrọ gwa ndi nta akụkọ ụlọ mgbasa ozi bụ Voice of America okwu, ọ sịrị na imirikiti n’ime ụmụ ntorọbia ndi mgbago ugwu ala anyị ejeghị akwụkwọ chaachaa. Ọ gara n’ihu kwue na ụfọdụ ha malitere agụm akwụkwọ mana ha siri n’ụlọ akwụkwọ gbapụ.

Buhari sịrị na ọnụ ọgụgụ ụmụ Naijiriya dị na agbata otu naari nde na nde iri asatọ nankwa otu naari nde na nde iri itolu. Ọ sịrị na ụzọ iri isii n’ime otu naari n’ọnụ ọgụgụa bụ ụmụ ntorọbịa di afo iri atọ were gbadawa.

O kwuru na ya kenere Chukwu n’ihi na ihe akọrọ n’ugbo di mma n’afọa. N’okwu ya ọ bụrụ na ọbụghị nkea, ihe na-eme n’ala anyị ugbua aka ka njọ.

Ọnye isi ala sịrị na ụmụ ntorọbia mgbago ugwu ala anyia anaghị enweta ihe na-egboro ha mkpa ha, ọbụladị mgbe ha gara ichọ ihe ha ga-eri n’akụkụ ebe ndi ọzọ.

Buhari gosiri obi iwe ya na ndi nta akụkọ ala anyị anaghị ekwu ihe ka ndi ha gbara ajụjụ ọnụ siri kwue. Ọ sịrị na ndi nta akụkọa na-ekwu nanịṅ ihe masịrị ha.

Anyị anụbeghị ọnụ mmiri okwu ụmụ ntorọbia mgbago ugwu maka okwu onye isi ala nke ikpe azụa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

nine − eight =