ANWỤCHIELA NDI NCHỊ EHI BU NGWA AGHA…

Spread the love

Ndi agha, ngalaba nke akpọrọ guards Brigade nọrọ ụnyahụ gosi ọhaneze ndi nchị ehi dị iri atọ na isii n’ọnụ ọgụgụ, bụ ndi nke ha jidere n’okporo ụzọ si Abuja gawa Keffi n’ụbọchị ụka gara aga.

N’otu aka ahụ, anwụchikwara ndi nchị ehi di iri ise na isii n’ebe akpọrọ Dantata Check point n’ụzọ siri Kuje gawa ọdụ ugbọ elu Abụja.

Ọbụ n’ihe dịka elekere anọ na ọkara nke chi ofufo n’ụbọchị ụka gara aga ka anwụchiri mmadụ iri atọ na isii nke ụzọ Keffi, n’ime ụgbọ ala Diana eji ebu ngwongwo nakwa n’ụgbọ mkpori ndụ bụ Toyota Camry.

Ndi kpara ike ndia bụ ndi agha nke 117 Guards Battalion Keffi. Ọbụ onye okwuputa okwe nke yabụ battlion bụ Captain Bashir Jajira gbara ndi nta akụkọ ama okwua ụnyahụ.

Ọ sịrị na mgbe agbara ndi nchị ehị ndia ajụjụ ọnụ, na ha kwuru na ha na-aga okpuru ọchịchị ime obodo Nasarawa dị na steeti Nasarawa. Jajira sịrị na mgbe emere ha nnyocha nke ọma, na-esiri n’aka ha nweta ọtụtụ ngwa agha dịka nke ọ kpọrọ, otu egbe eji pump action mara, mgbọ egbe dị n’ụdị dị iche iche. Mma mpọma nakwa obere mma tinyekwara njiri mara ndu nchị ehi bụ mkpara. Ọ sịkwa na enwetakwara ọkụ mpịpị nakwa ekike ọgwụ dị iche iche biazia tinyere ọgwụ ike dikwa iche iche.

Abia na ndi nke ejidere n’ụzọ si Kuje gawa ọdụ ụgbọ elu Abuja, enwetara egbe nkịtị di iri abụọ na isii, nakwa mma mpọma dị iri anọ na itolu tinyekwara ụmụ obere mma n’aka ha.

Jajira sịrị na ndia niile, n’ime okwu iji zọrọ onwe ha, sịrị na ha na-achọgharị ndi ori na-apụnarị ndi otu ha ehi ha n’iké

Ọchị agha Jajira kwuru na-aga akpụgara nd uwe ojii ndia ejidere maka iga n’ihu n’ime ha nnyocha.

Onye isi usuu nke ndi agha Guards Brigade ahụ bụ Brigadier General Musa Yusuf gwara ndi nta akụkọ na njidea ejidere ndia na-egosi njikere ndi ọrụ ya dị ikpochapụ ndi arụrụmala n’isi obodo Abuja.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

nineteen + eight =