ONYE NTỌRỊ MMADỤ BỤ EVANS KPỌRỌ EKWO NKỤ…

Spread the love

Nwoke ahụ nwere ego na-esi isi ma bụrụkwa dike-na-ajị na ịtọrọ ndi mmadụ kpara ndi mmadụ ụka ọchị n’ụlọ ikpe dị na Legọs n’ụtụtụ tata.

Nwa-amadịa bụ Chukwudumeme Ọnwụamadike eji Evans mara jụrụ jụwa isi ịrịtu n’ụgbọala ndi nga eji buru ya bịa ụlọ ikpe.

Nwokea ana-ebo ebuboo ịtọrọ ndi mmadụ ka ana-atọ nwa nkịta nakwa iji ngwa agha na enweghị ikikere kpọrọ ekwo nkụ ma jụ kpam kpam isi n’ụgbọala eji bute ya ụlọ ikpe ukwu ahụ dị na Igboshere n’ala mmiri gbara gburu gburu na Legọs ritue.

Evans mechara mara na nsị kpọrọ nkụ na-enwụ ọkụ mgbe onye ọka ikpe nyere ikikere ka ewere iké dọtue ya n’ala.

Ndi nchekwa ndi nga butere ya ụlọ ikpe sịkwara na ọ gbara isi akwara ibanya ụgbọ-ahụ n’ụlọ nga tupu ha-abịawa ụlọ ikpe n’ụtụtụa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

2 × 1 =