LEKWA M, LEKWA MKPIRISI AKA M, LEKWA DI M ỌMA!

Spread the love

Na mba Zimbabwe, ka otu nwoke kachiri obi were ọdị ya n’obi gbaa akwụkwọ na-agbanyeghị na agụ iyi atabiela otu aka nwanyị ahụ. Agbara akwụkwọa n’ụlọ ọgwụ bụ ebe ana-agwọ nke nwanyị

Nke nwoke bụ Jamie Fox gwara ndi nta akụkọ na ha nọrọ n’ime otu izu ụka nweta akpata oyi ma nọkwara ya banye n’ime nnukwu obi añụrị.

Fox na ọdị ya n’obi bụ Zanele Ndlovu gara n’ime mmiri ukwu Zambezi maka ịkpara ụgbọ mmiri, ebe agụ iyi bara ha ọgụ ma tabiri otu ogbe aka ọdị ya n’obi ka ọnwa Epurel dị n’abalị iri atọ n’afọa. Agụ iyi ahụ tabiri aka nri nke nwanyị ma merụkwa ya ahụ n’aka ekpe ya. Mana ka ọ gasịrị abalị ise mmadụ abụọ ndia gara n’ihu ma gbara onwe ha akwụkwọ n’ime ụlọ ọgwụ.

Fox sịrị na obi dị ha mma na ha dị ndụ ma gbaa akwụkwọ ha ka ha siri kwadoo na mbụ.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.