NDI IKE EBURULA ỤGBỌALA BISHỌP

Spread the love

Ndi oji egbe ezu, amabeghị ndi ha bụ, nọrọ n’ụbọchị ụka gara aga nọchie bishọp ndi ụka Anglikan, dayọsis nke Makọdi, bụ Rt. Rev. N. N. Inyom ma buru ụgbọala ya.

Nkea mere ka nnukwu ụkọchukwua gafechara obodo ana-akpọ Gondozua, n’okporo ụzọ gawara Zaki-Biam.

Ọbụ n’ihe dịka mgbe ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere abụọ nke ehihie ka ndia nọchiri nnukwu ụkọchukwua nakwa nwunye ya bụ Oriakụ Becky Inyom, tinyekwara onye jiri ya ọkwa Chaplin bụ Rev. Cletus Iorliam nakwa mmadụ abụọ ndi ọzọ.

N’ozi si n’aka onye mgbasa ozi nnukwu ụkọchukkwua bụ Terna Umah pụta, ekwuru hoohaa, na emerụghị nnukwu ụkọchukwua na ndi o bu n’ụgbọ ala ya ahụ, kama na ha buuru ụgbọala ya.

Ozia gara n’ihu yọọ ọhaneze, ka onye ọbụla hụtara ụgbọalaa wegara ndi uwe ojii ozi maka ijide ndi oji egbe ezua nakwa ibuchitera ụkọchukwua ụgbọala ya.

Ọ sịrị na ụgbọalaa na-acha ọla-edo ọla-edo, bụrụkwa ụgbọ nkpori ndụ nke akpọrọ Lexus.

Akara ya bụ ABUJA, RSH 668 AM.

Ozia gakwa n’ihu kene ndi niile na-ezitere nnukwu ụkọchukwua na nwunye ya ozi ntasi obi maka ihea mere ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

11 − three =