6 Comments

  1. 1. Elelia nwa ite, ya agbonyuo oku




    0



    0
  2. 1. Ite ọhụrụ g’emechaa hụ ihe ite ochie hụrụ.
    2. Ọkụkọ n’ewere ite iwe, chefuo mma gburu ya.
    3. Onye na-amaghị ụzọ iyi, ya sowe mpekere/mpempe ite.
    4. Mkpi abụọ n’añụ mmiri n’otu ite ga-asọkọta mpi.
    5. Azụ ọkpọ gwuru mmiri ukwu, gwukwaa mmiri nta, ṅma lagbuo n’ite ofe.




    0



    0
  3. 6. Nshịkọ sị na ya gwuru iyi ukwu, gwukwaa iyi nta, ma ite ofe agadị nwanyị sụkpọrọ ya anya.
    7. Isi ehi anaghị agbọ n’ite.
    8. Obere ite n’agbọ n’ọkụ ngwangwa/ọsịsọ.
    9. Ihe dị mkpa n’aga n’ime ite.
    10. Ite kacha mma anaghị amịta nri.
    11. Nanị nnụnụ ọnụ ogologo na-añụ mmiri n’ite.
    12. Ite n’esi nri, efere na-anara ekele.
    13. Ọkpụ ite n’eji mpempe/mpekere ite eri nri.
    14. Ite n’enwere ọnọdụ n’elu ọkụ.




    0



    0
  4. . Nwa ewu tiwara ite nọ na nsogbu.

    2. Ọbụghị mkpọkọrọ ite kowere onwe ya.

    3. Ọ bụ aka mere ite, ite jiri mee kpokororom.

    4. Onye m biara be ya sibe ite egheghị eghe, mụ aghọọ ọbịa ala ala.

    5. Ndi ite esoghị ndi ahia.

    6. Onweghị ihe okụ ga-eme ite ọla.

    7. Kama ite m sinyere n’ọkụ agaghị eghe eghe, nkụ m kpatara n’ọhia ga-agwụ.

    8. Okokporo na-ete nkwụ na-esi ite, ma nkwụ ya echughị, ite ya echue.

    9. Erichaa nri ma asaghị ite, ite agbaa ama ihe eriri.

    10. Nwa oke asaghị anya kwụrụ okwuchi ite mmanụ, mgbe ọ ga-eto, o buru ite mmanụ.

    11. Ọkụkọ hapụrụ mma gburu ya ga tụgọbara ite ofe onu.

    12. Anaghị ama ọkụkọ ọcha n’ite ofe.

    13. Esinye ite anụ ụzọ nabọ njem nje egbue nwa nkịta.

    14. Mpekere ite arụghị ihe ọzọ ọrụa ngụta ọkụ.

    15. Onye bu ite mmiri anaghị agba ọsọ.

    16. Ọ bụ mata ghara ka ọkụ ji hapụ ite gbue ihe dị n’ime ya.

    17. Ọkụkụ ntị ike na-anụ ihe n’ite ofe.

    18. Okenye ji anya eke nri dị n’ite.

    19. Ama ka ite adịna oji ma ya sie nri di ọcha.

    20. Eku na-eje be ite mana ite anaghị eje be eku.

    21. Onye rijuru afọ tiwaa ite, o chere na agụụ agaghị agụ ya echi?

    22. Enweghị nnu, enweghị ose anaghị anapụ onye butere ite mmanya ịracha aka.

    23. Onye mgbọ tụrụ nna ya n’isi na-eji ite ọla akwa okpu.

    24. Okwute ria elu, egwu atụwa ite mmiri.

    25. Anaghị atụnye okwute n’ebe adọwara ite mmanụ.

    26. Ama ana-agbara onye chọrọ idebe ite bụ ‘lekwa okwute’.

    27. Nkpụrụ akwụ dabara n’ite mmanụ sị ka ahapụ ịchọ ya n’ihi na ya alaruela be nna ya.

    28. Ihe anyị hụrụ n’ite abụzịghị ofe.

    29. Ọ bụ onye bu nkata ụtara na-achọga onye bu ite ofe.

    30. Mpoto mpoto na-asụ n’ite.

    31. Ite ọkụ bata n’ọba, egwu atụwa mkpụrụ ji.

    32. Esinye ite nri n’ọkụ ụjọ ejide agụụ.




    0



    0
  5. 33. Onye nrịtụ nri anaghị ahụ ike ite.

    34 Etoo aka kpụrụ ọkụ (ochiri), ọ kpụọ ite.

    35. Nwata riri ihe bukarịrị isi ya ibù gini ọzọ ka ọ na-achọ n’ite?




    1



    0
  6. ỌGBỤGBA OKWE: CHIDERA UNAMBA 1, DỌKỊNTA ACHỤKỌ 11, SAỊ NWENYA 34. SAỊ NWENYA eturuwo ugo




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

20 − 14 =