NAFDAC, laghachinu n’ọdụ ụgbọ mmiri-Osinbajọ

Spread the love

NAFDAC, ụlọ ọgwụ na-ahụ maka ihe gbasara ọgwụ na nri n’ala anyị ekwuola na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Ọkammụta Yemi Osinbajọ enyela iwu ka ha laghachi n’ọdụ ụgbọmmiri ozigbo ozigbo.

Iwu a biara ka o tebeghi aka Onyeisi NAFDAC bụ Mojisola Adeyeye boro ebubo na oke ịṅụ ọgwụike dị n’etiti ndị ntorọbia taa na Naịjiriya sitere na ntụbata ụfọdụ ihe ndi iwu machibidoro.

NAFDAC kwuru na mkpebi a ga-enyeaka ibelata ntụbata ọgwụike na ihe ndị ọzọ na-adịghị ahụ mma na Naịjirịa a na-ebubatazị n’eleghị anya n’azụ.
Onyeisi NAFDAC ahụ kwuru sị,”NAFDAC natara akwụkwọ Osote Onyeisiala weputara n’abalị ụri n’isii nke ọnwa Mee.”

Adeyeye kwuru na ọtụtụ ndị Naịjirịa anwụọla maka ọgwụ ike na nri na adịghị ahụ mma na nso nso a.
Ọ kọwara na ọgwụike dịka Codeine,Tramadol, na pentazocine egbuola ọtụtụ ndị mmadụ.

Ọ sịrị na ọnwụ ndị a dapụtara n’ihi na e wepụrụ NAFDAC na ọdọ ụgbọ mmiri kemgbe 2011.
Adeleke kwuru na ọ bụkwa maka ihe nnyocha ndị BBC mere nke gosipụtara nnukwu ọghọm dị n’ọgwụ akpọrọ Codeine wetara uche NAFDAC n’ịlaghachị n’ọdụ ụgbọ mmiri.
O kwuru na NAFDAC ga-akwụsị mbụbata ọgwụike n’ọdụ ụgbọ mmiri nile dị n’ala anyị.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

eighteen − 2 =