NDI ỤKA KATỌLIK NKE ABUJA GA-EME NGAGHARỊ UDO

Spread the love


Ụka Katọlik nke dayọsis ukwu bụ Abụja ehiwala ubọchị Tusdee na-abia abia iji mee ngagharị udo maka igosiputa nwute ha maka ọbara ụmụ mmadụ ana-akwafụ ka nke anụmanụ n’ala anyị.

N’akwụkwọ ozi ha wepụtara nke ọbụ aka na-achị yabụ nnukwu dayọsisi ahụ bụ John Cardinal Onayekan tinyere aka n’ime ya, ha sịrị, ‘na iji dọnyere ogbo anyị bụ dayọsis nke Makọdị ukwu nakwa iji gosi ka osi ewute anyị maka ọbara ụmụ mmadụ ana-akwafu na naijiriya, anyị chọrọ igosi iwe anyị maka arụ na-eme na Naijiriya ma kpekwa ekpere maka ala anyị.’

Ozia gara n’ihu kwue na onye kpọrọ okua bụ John Cardinal Onayekan. Ọ sịrị na ebum n’obi ngagharia udoa bụ maka ikpere Naijiriya ekpere.

Ozia sịrị na-aga enwe ofufe nru, kpee chapuleti nke ogbara na ogbara, biazia gwa ndi nta akụkọ sigasị mba ofesi nakwa nke ndi ala anyị okwu ma were ụka ngọzi mechie.

Ozia kwuru na ngagharia ga-adị n’ụbọch Tusdee abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa ise n’afọa.

Ngagharia nke ga-amalite n’elekere iri nke ụtụta ga-esite na ogige ndi ụka Kraist ahụ dị n’Abuja bụ National Christian Centre were gaba ụlọ ụka ndi Katọlik bụ Our Lady Queen of Nigeria Pro Cathedral dị na Gariki Abuja.

Ozia kwuru na ndi ụkọchukwu ga-eyi uwe nwụda ha ebe ndi ọzọ ga-eyi uwe njiri mara ụlọ ụka ha si bia mọbụ yiri akwa ojii. Ekwukwara na ndi ụkọchukwu ga-eke ekike akwa ọcha n’oge ofufe nru.

Ebe ije aga-eje tere nwa obere aka, agwara onye ọbụla ga-eso mee ngaghria ka ọ gbaa mbọ yite akpụkpọ ụkwụ agaghị enye ya nsogbu n’ụkwụ.

Akpọkwara oku ka ndi ụka ndi ọzọ na abụghị ndi ụka Katọlik sonye na ngagharia ebe ihe na-eme imi na-emekwa anya.

Ebe ngagharia bụ nke udo, adọrọ ndi ọbụla chọrọ nsogbu aka na ntị ka ha ghara isonye na ya.

Cardinal Onayekan sịrị na a chọrọ iji ngagharia zipuru gọọmenti ala anyị nakwa ụwa niile ozi maka mkpa ọ dị igbanwe ajọ ọnọdụ Naijiriya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.