ONYE ISI NDI UWE OJII AGỌỌLA AKA NA ỤKWỤ YA…

Spread the love

Onye isi ndi uwe ojii ala anyị bụ IGP Idris Ibrahim ekwuela na onyonyoo ahụ na-aga n’ihu ugbua igosi na ya agụpụtaghị mkpụrụ okwu di n’akwụkwọ ọfọma mgbe ya na-agwa ndi mmadụ okwu na Kano bụ ọkpụrụkpụ asị.

Idris kwuru ihe ndia mgbe ona aza ndi mmadụ ajụjụ na mmemme ọba ozi akpọrọ ‘jụọ ndi uwe ojii’. Ọ sịrị na ndi mmadụ gbara okwu ya kwuru ọgwụ ma mee ka okwu ya ghọọ ihe ọzọ.

N’ime onyonyoo ahụ, eseputara ebe onye isi ndi uwe ojiia na-ata okwu ka a na-ata anụ ọkpụkpụ juru ahụ niile. N’ime ya, ọ sụrụ nnukwu nsụ ma kpọkwa otu okwụ ọtụtụ ugboro mana okweghi ya mkpọta.

Na-agbanyeghị agụgọọ niile Mazi Idris gọrọ, ọtụtụ ụmụ Naijiriya, ndi na-akpa agwa ka nwa-azụ Jizọs bụ Tọmọsị ka na-agwarịta ya sị, ọbụrụ na nke ha hụrụ bụ asị, ya weputa nke okwuru ihe achọrọ ka o kwue.

Leave a Reply

Your email address will not be published.