ỌRỤ EBUBE!!! OTU NWANYỊ MỤRỤ ỤMỤAKA ISII N’OTU NJE

Spread the love

Otu nwoke nakwa nwunye ya ka na-enwerịta ọñụ pụrụ iche ka odịchara otu afọ ha jiri mụọ ụmụaka isii n’otu nje. Nwokea na nwunye ya bụ ndi Naijiriya bi na mba Amịrịka.

Akụkọ na-ekwu na ndia ebiela afọ iri na asaa na amụtaghị nwa.

Eseptara onyonyoo ụmụaka isii ndia ma tinyekwa ha na ọba ozi ikuku iji mee mmemme na ọ agbaala otu afọ ejiri mụọ ha.

Ọbụ Ajibola nakwa Adeboye Taiwo bụ ndi ihe ọmaa mere. Ụmụakaa dị ụmụ nwoke atọ nakwa ụmụ nwanyị atọ.

Amụrụ ha ka ọnwa ise n’afọ gara aga dị n’abalị iri n’otu, ma bụrụkwa ndi dibia oyibo iri anọ jiri ime ha.

Nwanyịa bụ Ajibola mụrụ ụmụaka ndia site n’iwa afọ ka ọ dịchara izu ụka iri atọ o jiri tụrụ ime ha.

Ekwuru na ọ ọbụ ndia bụ ụmụaka izizi di isii amụrụ n’otu nje n’ụlọ ọgwụ akpọrọ VCU medical Center nke Amịrịka.

Di na nwunyea nọchara ọtụtụ oge tupu tụrụ ime ụmụakaa, ka-ekwuru na ọñụ gburu ha ka mmanya mgbe ha chọpụtara site n’onyonyoo emere, na ụmụaka ha nọ n’afọ ime ahụ dị nyafụ nyafụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

7 − four =