ANYA MMIRI! ANYA MMIRI!! ANYA MMIRI!!!

Spread the love

Tata, ndi mmadụ bebutara anya mmiri n’ụzọ dị egwu mgbe eliri ndi ụkọchukwu abụọ nakwa ndi ụka mmadụ iri na asaa ndi ọzọ bụ ndi, ndi nche ehi jiri egbe dulaa mụọ n’izu ụka ole na ole gara aga na Makọdị bụ isi obodo steeti Benue.

Ọbụ n’ebe ana aga ekpere pụrụ iche nke bụ Ayati pilgrim site, didebere Ikpayongo na okpuru ọchịchị ime obodo Ọwụwa anyanwụ Gwer ka-anọrọ lie ndia.

Aka na-achị steeti Benue bụ Samuel Ortom adịlarị na mbụ mee ụbọchị taa ụbọchị ezum ike na steeti Benue maka ikwanyere ndia ugwu ikpe azụ.

Anyị ga-echeta na n’ime izu ụka ole na ole gara aga, ka ndi nche ehi jiri egbe wakpo ụlọ ụka ndi Katọlik bụ St. Ignatius nke dị na Ayar Mbalom, n’okpuru ọchịchị ime obodo ọwụwa anyanwụ Gwer. Nebe ahụ ka ha nọrọ gbagbue ndi ụkọchukwu abụọ bụ Rev. Fr. Joseph Gor nakwa Rev. Fr. Felix Tyoloha tinyekwara ndi ụka mmadụ iri na asaa ndi ọzọ biara ofufe nru ụtụtụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

eight + five =