NDI ỤKA KATỌLIK NA NAIJIRIYA MERE NGAGHARỊ IWE NKE UDO TAA

Spread the love

Ndi ụka Katọlik na Naijiriya gbaa gburugburu nọrọ na steeti di iche iche n’ala anyị mee ngagharị iwe n’udo taa.

Bishọp ukwu nke Legọs bụ Arch bishọp Adewale Martin sịrị na nkea biara site na ntụzi aka ndi bishọp ụka Katọlik Naijiriya niile.

Arch bishọp Adewale sịrị na nkea bụ iji dọnyere ndi dọyọsis nke Makọdị ukwu na ile ndi ụkọchukwu nakwa ndi ụka ndi ọzọ ndi nchị ehi gbagburu n’isi nsoa mgbe ha na-aka ụka na Makọdị.

Ọtụtụ ndi ụka Katọlik na steeti dị iche iche n’ala anyị niile dịka Edo, Oyo, Benue, Legọs, Kaduna, Adamawa nakwa ndi ọzọ nuputara n’igwe maka ngagharị iwe nke udoa.

Ha bukwa ọtụtụ ibodibo akwụkwọ edere ihe n’ime ha mee ngagharịa.

Onye nta akụkọ hoohaa gara Suleja dị na steeti Niger maka ngagharia. Okwuru na ngagharịa gara nke ọma ebe ahụ. Hoohaa chọpụtara na emeghị ngagharịa ka esiri kwadoo n’ime Suleja maka na ndi nchekwa dị n’aka n’ebe ahụ dọrọ aka na ntị ka aghara ime nkea n’ihi na ha nụrụ kepu kepu na enwere ndi na eme njikere ime ọgbaghara.

Etu o sina dị, ha mere ngagharị n’akụkụ ụlọ ụka St. Mary di na Suleja. Ebe ha agaghịzi isụ okpuru ọchịchị nke Suleja dika akwadoburu na mbụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.