ONYE GBUWE ACHARA, ONYE GBUWE…

Spread the love

Otu nna na nwa ya kpara ndi mmadụ ụka ọchị dị egwu n’otu ụlọ nkonye aka ime abalị n’obodo ana-akpọ Eldoret dị n’ọdịda anyanwụ nke Kenya.

N’ihe dịka elekere iri na otu nke ime abalị ka nwokea nọrọ n’ebe ọ na-ekpori ndụ nepu anya hụ ka otu nwagbọbịa na otu nwa ikorọbịa na agba egwu awantịlọ, na-emetụ onwe ha aka n’ebe na-aba n’ụbụrụ.

Ihe tụzịrị nwokea n’anya nke ukwuu abụghị sọsọ na ana-emetụ nke nwanyị aka n’ebe ekwesighị ekwesi, kama na ọ chọpụtara na nwa agbọgọbịaa bụ nwa ya nwanyị. Ọ chọpụtakwara na nwa ya nwanyịa añụbigala mmanya oke. Obi mebiri ya.

Ọbụghị na nwata nwanyịa tara anụ nkịta na-ewute nna ya, kama, ọ tachara ya ma ñụa mmiri ejiri sie ya. Nwagbọgọbịa kwesiri ịnọ n’ime ụlọ akwụkwụ mana ọ hapụrụ araa na-añụ akpụ. Ụdị uwe nwanyịa yi mgbe nkea na-aga bịazịrị mee nna ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma.

Nwokea jiri nwayọọ ga dọkpụrụ nwa ya ahụ ga n’otu agịga. Nke nwanyị chere na nwoke ọzọ chọrọ ka ha gbaa egwu abịala, ọ maghị na ọ bụ nna ya ganye mgbe ọ kụwara ya ihe ụzụ na-akụ igwe.

Mgbe nkea na-aga, nwoke ya na nwagbọgọbịaa so bia ụlọ nkonye akaa haprụ ya wara ọsọ.

Nwokea beputara anya mmiri ma sị: ‘obi gbawara m mgbe m hụrụ na nwam nwanyị kwesiri ịnọ na ụlọ akwụkwọ dị na Kisii bịara na-agbarị egwu nkonye aka ebea’.

Ọ sịrị n’ọbụ unyahụ ka ya ka zigara ya ego maka inyere onwe ya aka.

Ọ gara n’ihu sị na ya na-ahụbu nwa ya dịka ezigbo onye ụka, mana kịta, ọkụ esighị ite nke mma na-aba ji. Ọ sịrị na okwu ekweghị ya okwukwu.

Nwagbọgọa nke aha ya bụ Louise hapụrụ ụlọ akwụkwọ nke ya bịa ime enyi ya nwoke obi pọlina-pọlina na mahadum nke Eldorat.

Ọbụrụ gị bụ nna dị otua, gwa anyị ihe ị ga-eme.

Ma marakwa na asị “onye gbuwe achara onye gbuwe, onye akpọla ibe ya onye íkoyí!

Leave a Reply

Your email address will not be published.