ỌKWA DỊ MKPA!

Spread the love

Tinye igwe okwu rediyo gi na ụlọ mgbasa ozi ‘DREAM FM, 92.5’ n’ụtụta tata bụ abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Mee anyị nọ n’ime ya, malite n’elekere itolu rue na elekere iri nke ụtụtụa ka ị mara ka eke si anya anwụ n’ihe mmemme ha bụ ‘OLU NDI ỌCHỊCHỊ’ mọbụ ‘POLITICAL VOICES’ n’asụsụ bekee.

Isi okwu ahụrụ kwaba okpu bụ okwu aga etinye ọnụ bụ: ndi nkịtị nakwa nhọputa nke afọ puku abụọ na iri na iteghete.

Ndi ga-etinye ọnụ n’okwu bụ: MAZỊ IKECHUKWU BISMARCK ỌJỊ bụ onye ji ọkwa ntụzi aka ụlọ mgbasa akụkọ bụ hoohaa, bụkwa onye kpokọbara otu ndi nkịtị ndi Igbo akpọrọ Igbo Civil Society Coalition na bekee, Mazị Ikechukwu bụkwa onye jibu ọkwa onye isi oche ngalaba ụmụ na-eto eto nke Ọhaneze ndi Igbo.

Ndi ọzọ ga-eso kapia okwu ọnu na mmemmea bụ, Kọmredi Ibụchukwu Ezike bụ onye ji ọkwa dịka onye isi oche otu ikwalite ikikere ndi nkịtị akpọrọ Civil Liberties Organization. Nwa-amadịa sokwe jee ọgbakọ ndi ala anyị nke afọ puku abụọ na iri na anọ.

Onye ọzọ bụ ọka-iwu Chidimma Udegbunam bụ onye ọ na-anụ ọkụ n’obi na onye ọbụla nwtara oke na ikikere ruru ya.

Ihe omumea ga-adịkwa egwu. Ekwekwana ka akọrọ gị ya akọ, kama gbaa mbọ ka ị kọrọ ndi ọzọ

Leave a Reply

Your email address will not be published.