CHAỊNA KA NA-AGA N’IHU IMECHI ỤLỌ EKPERE NILE

Spread the love

Xi Xinpeng, Onyeisiala mba Chaịna

Ka imechi ụlọ ekpere ndi okpukpere chi nile ka na-aga n’ihu na mba Chaịna, otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji na-achị mba ahụ bụ Communist Party etierela ọchịchị imeobodo ha iwu ka ha machibilata akpụrụakpụ okpukperechi dị iche iche dị n’ama.

Iwu a dị ka ndi e bu n’obi were tie ya bụ maka ndi okpukperechi Buddha nakwa Tao, bụ abụọ n’ime okpukperechi ise nke ndi ọchịchị mba ahụ nyere ikike.

Puku pụrụ puku ụlọ ekpere ndi Buddha, ndi Tao, ndi Alakụba nakwa ndi Ụka ka ndi otu communist mebiri n’oge iweta mgbanwe n’ike ha mere site n’afọ 1966 ruo afọ 1976. N’agbanyeghị n’ọtụtụ n’ime ha emeghekwaala, iwu ọhụrụ nke malitere afọ a nke tinyere ha nile n’okpuru otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị communist ndi na ekwenyeghị na Chukwu.

Mba Chaịna bụ ndi a maara maka ịkpagbu ndi ọbụla kwenyere na Chineke

Leave a Reply

Your email address will not be published.

19 − 4 =