NWOKE INDIA JI MKPỤRỤ EZE YA ASAA KWỤỌ ỤGWỌ ỌNWA

Spread the love

Exif_JPEG_420
NWOKE INDIA JI NKPỤRỤ EZE ASAA KWỤỌ ỤGWỌ ỌNWA

Otu nwoke dị afọ iri abụọ na atọ bụ Ismail Yusuf jiri nkụ-ntu (hammer) kụpụ nna ya ukwu mkpụrụ eze asaa maka na o kweghị akwụ ya ụgwọ ọnwa.

Nwokea bụ Ismail kwuru hoohaa, na ya kpara ụdị ikea.

Aha onye akụpụrụ eze asaa n’ọnụ ya bụ Sattish Kasara, ọbụ onye mba India. Ọ bụ onye ntụzi aka ụlọ ọrụ na-agbapu mmiri, akpọrọ Bolaji Drilling Company na Minna dị na steeti Niger.

Ihea mere n’ogbe Tunga na Minna, kpatara ndi uwe ojii jiri nwụchie nwokea bụ Ismail. Akụkọ kwuru na ihe nwoke India jiri jichie ụgwọ ọnwa Ismail bụ na ọ nụrụ kepu kepu na Ismail na-akwdo ije Bauchi maka ihụ nne na nna ya. Nwoke India tụrụ egwu na Ismail agaghị alọghachite ma ya mee yabụ njem.

Ismail kwuru na ọ bụ ihi ekweghị ịkwụ ya ụgwọ ọnwa ya tinyekwara na ọ naghị ekwezị ege ya ntị ka ya ji were iwe na ọnụma wakpo ya ma kụpụ ya mkpụrụ eze asaa n’ọnụ.

Ismail sịrị na ya arụgoro nwoke India ọrụ ihe karịrị afọ ise na ejebeghị hụ ndi ibe ha anya. Ọ sịrị na nkea na-agbawa ya obi nke na ya enweghịzị ike idiri ya gaba n’ihu.

Ọ sịrị: anaghị m ayọ ya ka o mere m amara kama ọ bụ ụgwọ ọnwa m ka m chọrọ ka ọ kwụọ m.

Ismail gara n’ihu kagbue ajọ akparama agwa ndi mba ofesi nwegasịrị ụlọ ọrụ n’ala anyị na-akpaso ndi ala anyṅ nke bụ arụchara ha ọrụ ha-ajụ ikwụ ụgwọ ọnwa.

Ọ jụrụ sị, kedu ka m ga-esi rụchara onye mbia mbia ọrụ n’ala m, ọ jụ ikwụ m ụgwọ ọrụ m? Ọ jụrụkwara sị nkea ọga-emenwu n’obodo ha?

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze nakwa ndi uwe ojii na steeti Niger bụ Mohammed Abubakar kwuru na ndi uwe ojii natara Ismail nkụ ntu nakwa okporo igwe nwere ụmị (pipe). Ma kwue na aga akpụpụ yabụ Ismail ụlọ ikpe ma emechaa nnyocha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

4 + 1 =