3 Comments

  1. 1. Oke soro ngwere maa mmiri, ya kọọla ngwere ọgaghị akọrọla oke.
    2. Mmiri riri enyi ka mbe hụrụ na-awa ọgọdọ, ọ g’efe mmiri efe ka o g’awụ ya awụ.
    3. Onye sị na ya anaghị ata anụ nkịta, ya hapụ mmiri ofe ya.
    4. Azụ ọkpọ gwuru mmiri ukwu, gwukwa mmiri nta, ma lagbuo n’ite ofe.
    5. Nshịkọ sị na ya gwuru mmiri ukwu, gwukwaa mmiri nta ma ite agadị nwanyị sụkpọrọ ya anya.
    6. Ama ka mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ?
    7. Nwanyị mụta ite ofe mmiri mmiri, di ya amụta ịpị ụtara aka were suru ofe.
    8. Ọkụkụ sị na ihe ya ji ele anya n’elu ma na-añụ mmiri bụ na ihe n’egbu ya si n’elu abịa.
    9. Anaghị eji ụkwụ abụọ elele omimi mmiri.
    10. Ana eji ụkwụ achọ ihe dị na mmiri.
    11. Ebule abụọ anaghị añụkọ mmiri n’otu ite, ha ga-akụkọta mpi.
    12. Mmiri mara agụokpo anaghị asachapụ akara dị ya n’ahụ.
    13. Ụgbọ na adaba na mmiri achọghị onye ndú.
    14. Mmiri anaghị atọ n’ahụ ngwere.




    0



    0
  2. 1. Onye bi n’akuku mmiri anaghi eji mmiri asu akwo aka




    0



    0
  3. 15. Isi mmiri adịghị ata ata.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.