Ọrịa Retinopathy of Prematurity (ROP).

Spread the love

Ginị bụ ọrịa Retinopathy of Prematurity (ROP)?

Ọrịa Retinopathy of Prematurity (ROP) bụ nsogbu anya nke n’emetụta ụmụaka amụrụ na-akaghị aka, ndị dị 2¾ pounds (1250grams) ma ọbụ dị ala, ndị amụrụ oge n’erughị izu ụka iri atọ na otu.

Nwa a mụrụ ọhụrụ ipe oke mpe n’akpata ọrịa ROP.

Nsogbu anya nkea n’adị na anya abụọ, n’ebute nwa ọhụrụ ikpu isi oge amụrụ ya ruo ebighị ebi.

A matara ROP nke mbụ na afọ 1942.

 

Ihe na-ebute ọrịa ROP.

Ọrịa ROP na-adị mgbe akwara ọbara n’adịghị mma toro na ala anya (retina). Akwara ndia esighị ike, ha n’ebute retina detachment nke n’ebute nwa ọhụrụ ikpu isi.

 

Ọgwụgwọ ROP.

A na eji laser therapy na cryotherapy agwọ ọrịa ROP, ma ọgwụgwọ ya nwere ike ọgaghị adị ire. O nwere ike ịda mba.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.

12 + 3 =