17 Comments

  1. isi kote ebu, ogbagbue ya.




    0



    0
  2. Ndi mmadu kparasia akwu, isi akwu adoro onye nwe akwu.




    0



    0
  3. Odiri isi Mma, o diri aguba mma




    0



    0
  4. ogu karia, onye isi akworo onye ngwuro n’azu.




    0



    0
  5. Ekwuo ma nti anughi, e gburu isi, nti esobe ya.




    0



    0
  6. Nwa nza bere n’odu igu na-azo isi ya na-azokwa odu ya..




    0



    0
  7. onye nwe ozu na-ebu ya n’isi.




    0



    0
  8. onye mgbo guru nna ya n’isi na-eji ite ola emerge okpu.




    0



    0
  9. onye isi gaba n’abali ya buru oku, o jighi ya hu uzo, ndi madu ejiri ya hu ya.




    0



    0
  10. Ihe egbe huru gbaa oso, okuko ekwesighi ihu ya anya tupu o zoba isi onwe ya.




    0



    0
  11. E gosi onye isi uzo, o si na ya ahula anya.




    0



    0
  12. okuko siri na ya bu Eze, o bu ya kpatara e ji ebu ya n’isi aga mba.




    0



    0
  13. Author

    1. A gbakata Eze nkịtị, ekpudo nkata n’isi gwa ya okwu.

    2. Ka ahụ na anya ka mgbọ ji atụa enwe n’isi

    3. Onye nje nje ka onye isi awọ mara ihe.
    4. isi akwụ dara na ala emetụla aja

    5 Onye otu anya na abụ eze n’ala ndi isi.

    6 Mma di nkọ adi isi nke di isi adighi nkọ

    7 A tụọrọ ọ mara, ọ mara, ma a tụọrọ ọfeke, ọ fenye isi na ọhia.

    8. Ahapụ otele nyụrụ ahụ, avụọ isi ọkpọ

    9. Anaghi ahapu isi gwọwarụ otele (ike)ajụ

    10 isi kara aka na ebu ogidi

    11. udele isi kara aka na amapụ ozu afọ

    12 onye na enyo isi ya ana apụta

    13. Ama ka mmiri ezola,ala ga ahu isi ya

    14. Isi na isi ra bu n’onu, maka na mmadu ka ibe ya.

    15 Aturụ chọrọ ipụ mpi, isi ka kwa ya aka

    16Onye tua Chukwu okwute o zewe isi ya




    0



    0
  14. Author

    17.Ana agwa onye isi Ka mmanu di na ofe mana anaghi agwa ya Ka nnu si tu ofe

    18 Isi buru ibu anaghi ezenwu ọkpo.

    19 Nnụnụ isi akaghi aka anaghi eje nzụkọ ndi ọtụrụ kpọkpọ

    20 Udele si na onweghi ihe jikọrọ ya na onye okpu isi.

    21 Isi waba nkita ara, ọma jijiji amawa ujo.

    22 Anaghi eji isi nwa dibia ele ọgwụ

    23Anaghi ahapụ isi aka agba ụrom

    24 Ji esighi na isi puo ome osi na ọdụ




    0



    0
  15. Author

    25. Nshịkọ sị na ọ bụ ndi nwere isi ka isi na-awa.
    26. Isi ehi anaghị agbọ n’ite.
    27 Weta isi bia were isi bụ ajọ onyinye.
    28 Isi na-awa onye ka onye ha.
    29 Anaghị ama ebe agwọ abalị debere isi.
    30. Arụsị egburu ọkụkọ nwe isi ya.
    31 Achọwa isi ọchụ, agaa n’ụzụ kpụrụ mma.
    32 Isi onye ọbịa karịrị isi onye ọ bịara be ya.
    33. Isi anaghị agbakọta ihe obutere.
    34 Ọsọ ndụ bụ n’isi n’isi.
    35 Anaghị m aña ntị ekwe maka na ọ bụghị isi m ka eji akụ ya.




    0



    0
  16. 1. Anaghị m echere onye isi ukwu maka na ọ bụghị m ga-akwara ya okpu.
    2 Ọ bụ ngwere isi kara aka na-eje ọgụ nkume.
    3 Ahụ isi okwu, ahụ ọsịsa ya.
    4. Onye bu isi na-achọ isi ọ ga-egbu, ochefuela na nke ya bụ isi.
    5 Okenye taa isi ọkụkọ, ụmụaka abụa nri ụbụ.
    6. Onye taa m arụ n’isi ma ochetaghị ntụtụ isi m, mụ tawa arụ n’ike agaghị m echeta nsị dị ya n’ike.
    7. Ụka akara aka, eji isi ekwe ya.
    8. Ọkụkọ kpụwa isi ka nwa ya si anwụ, ọkpụpịa isi.
    9. Onye mgbọ tụrụ nna ya n’isi na-eji ite ọla akwa okpu.
    10. Ka eletechaa ka mgbọ ji atụwa nwa enwe isi.
    11. Onye isi ike na-eri n’ala kpọrọ nkụ.
    12. Ike nyụọ arụ, isi anara ọkpọ.
    13 Ọ bụ anya ukwu butere ibu ozu enyi n’isi were ụkwụ na akpa-abụzụ
    14 Onye njem ka onye isi awọ ihe mara.
    15. Anaghị ama ihe n’isi awọ.




    0



    0
  17. 1. Agwa nti ma nti anughi, ebere isi, nti esoro ya.
    2. Isi akwu dara na ala edetula aja.
    3. Isi kote ebu, ogbagbuo ya.
    4. Anaghi ahapu Isi aka agba uriom.
    5. Uka akpara akpa bu Isi ka eji ekwe ya.
    6. Mmiri na-esi na Isi agbaru.
    7. Ihe onye metara o were Isi ya buru.
    8. E buru ozu onye ozo n’isi , o dika ebu ukwu nku.
    9. Onye Isi adighi mma I bu onye odu.
    10. O bu na okpu Isi amaghi akpu ka o bu na aguba adighi nko?
    11. Ka onye ha, ka Isi na-awa ya ha.
    12. Onye ije na aka onye Isi awo ihe ama.
    13. O naghi adi mma ituchasi the di na isi azu.
    14. O naghi adi mma eburu ozu enyi na Isi ewere okpa na-akpa abuzu.
    15. Isi mkpi di na akpa mkpi.
    16. O kwa mgbo tuwara enwe isi.
    17. Isi nwa eze anaghi ato na mba.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.