ỌBỤMSELỤ: Mmemme Ncheta otu afọ e mere akwamozu ya

Spread the love

A nọrọ ụnyahụ bụ Sọnde, abalị iri nke ọnwa Juun, n’ụlọ ụka ndi Anglican nke St Faith dị n’Ezele,Ọba nke nọ n’Okpuru ọchịchị Ndịda Idemili nke Anambara Steeti were kaa ụka iji cheta otu afọ e jiri mee akwamozu otu onye Ndigbo ji eme ọnụ bụ Ọkammụta Benedict Ebele Ọbụmselụ.

Ben Ọbụmselụ bụ onye nka edemede, onye nwetara ọkwa ọkammụta n’afọ 1976. Ọ bụkwa ya bụ onye hiwere ma bụrụkwa Onyeisi mbụ, otu jikọtara ụmụ akwụkwọ mahadum nke ala Naịjiriya(National Union of Nigerian Students). Ruọ n’ọnwụ, ọ bụ otu onye ịgbaziri ụmụ akwụkwọ na ndi ntorọbịa na enye oke ọṅụ.

Ọbụmselu jibukwa ọkwa dịka Osote onye ndu, Ọhaneze Ndigbo. O sokwa na ndi hiwere otu ndọrọ ndọrọ ọchichị APGA.

Ndi bịara yabụ mmemme gụnyere nwunye ya Oriakụ Fidelia Ọbụmselu, Sinetọ Onyeabọ Obi, Ichie Tony Okeke-Ojiudu, Omenka Kris Okoye wdg.

Otu nwa ya nwoke bụ Chinọnso Ọbụmselu nọrọ n’ofufe nru ahụ were nye Puku Naịra Narị iri ise n’aha ndi ezinụlọ Ben Ọbụmselu iji kwado ọrụ ịrụ ụlọ ụka ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

four × 3 =