AFỌ (13-06-18)
2018-06-13
Taa bụ AFỌ; Avọ Emudo-Nenwe, Afọ udo nanka, Afọ ọkụnanọ(Gariki Enugwu), wdg. Kedu ndi ga-agara anyị ahịa? Ahịa hoo!haa!! bụ ahịa uru, azụọ azụta uru. Sọọsọ UJU NWANEKEZI zụrụ ahịa ụnyahụ, mgbe hoo!haa!! ga ebunye ya ego nrite ya, unu atakwalara ya anya. Ọ kacha ụmụnwanyị ibe ya
All Right Reserved: Hoo!Haa!
Na nke taa anyi gara Ahia AFO Emudo Nenwe. Nenwe di na Okpuru ochichi Aniri nke di na Enugwu steeti. Ndi Nenwe bu ndi eji oru ugbo were mara . Iga enweta otutu ihe di iche iche n’olu ala dika Ahikere(okpa ekere) Osikapa, Okwuru (okro) , ede, akwukwo nri di iche iche , mmanu nri, Anu jaki nakwa otutu ihe ndi ozo di iche iche . O bu na ahia ahu ka esi ekesasi anu Jaki na Obodo dicha na owuwa anyanwu ala anyi. Obodo gbara Nenwe okirikiri gunyere Mgbowo,Oduma, Mpu,Agwu.
0
0
A gara m AFO Ukpor. Ukpor di na okpuru ochichi Nnewi South Anambara Steeti. Ahia na-ekwo ekwo ubochi afo obula.
A na-ere otutu ihe na Afo Ukpor dika akwu, ukwa, ogiri, mangoro, oroma, ube Igbo na ube bekee; oka, egwusi, udara, akpu na okporo, ede, ugiri na ogbono; aku bekee, ogbe ugu, ugboguru. A na-ere ihe ndi a na nkata na nkata.
Ihe ndi ozo bu akwukwo nri di iche iche dika ugu, uziza, ahihiara, oha, nchu anwu, utazi na onugbo. A na-ere ha na ukwu na ukwu.
Ozo bu unere, ogege, mmanu nri, ewu na okuku, aturu na ukwu aziza.
Ndi na ere ihe ndi a bu ndi ime obodo. Uzo ndi abuo na- azuru na aka ha. Nke mbu, ndi na-azuru gaa na Obodo mepere emepe dika Onicha na Owere gaa ree ha. Nke a abuo, ndi na azuru ma ree ha na Afo Ukpor.
Ndi ozo na-ere ahia ebea bu ndi na- aga Obodo mepere emepe gaa zuta ihe dika mmanu opapa, ose, okwuru, osikapa, achicha, agwa, akpukpu na ihe umu nwanyi ji acho mma gaa resi ndi no n’ime Obodo.
A gara m zuo ihe ndi m jiri tee ofe oha dika oha, ede, akwu, ogiri, anu ewu, azu mangala, oporo, ose na okporoko. Azutakwara m ube bekee.
Ufodu ihe na-adi onu ala na Afo Ukpor.
0
0