10 Comments

  1. 1. aka mere azụ ọ gbaa nkọrọkọ
    2. onye naghara nwata anụ ga enye ya azụ
    3. onye ndidi na-eri azụ ukpoo
    4. azụ anụ ụka
    5. agbaghị ụzọ azụ owere mgba ọ gaghị echi




    0



    0
  2. 1. ndụ miri ndụ azụ, miri atala ma azụ anwụla
    2.




    0



    0
  3. Author

    IHE ANA ACHỌ NA IKE OKỤ BỤ AZỤ




    0



    0
  4. Author

    2 URU ADIGHI N’ISI AZỤ




    0



    0
  5. Author

    3. Mbe si na ibu bụ nke ya, ya mere o ji kwọrọ ya na-azụ
    4.Nje dị na azụ bụ azụ.




    0



    0
  6. Author

    5 Nwunye awo si na di atoka uto, ya jiri
    nuta nke ya kworo ya n’azu.
    6 Ebule la azụ ọ bụrụ ọgụ
    7 . Ọ biara be onye abiagbula ya, mgbe ọ
    ga-ala mkpumkpu apukwala ya n’azu.
    8 ogbu isi anaghi ekwe mma ga ya na azụ




    0



    0
  7. Author

    9 Etere ugba etere azụ ogiri bụ ọgwụ ofe.
    10. Enweghị oke mmiri na enweghị oke azụ.
    11. Nwa akwọ na azụ amaghị na ije dị ụfụ.
    12. Azụ amaghị onye ọ na-anyara anwụ.
    13. Ọkwọm n’azụ ụkwụm na-akpụ n’ala, ya hapụm kam were ụkwụm gawa.
    14. Agba ele anya n’azụ abụghị egwu kama ọbụ ike nkwucha.
    15. . Ọbụ oke ụlọ gwara oke ọhịa na azụ dị na ngiga
    16. Enwe sị na ya agaghị agọtara nwa ya kwọ n’azụ agọ maka onwere ike ịghọrọ ụtụ rachaa




    0



    0
  8. 1. Obere azụ kpata obere nkụ nnukwu azụ kpata nnukwu nkụ
    2. miri bụ ndụ azụ mana ọ bụghị maka miri ọkụ




    0



    0
  9. 1. Ihu di mma; ma azu ka ego.
    2. Azu kaa isi, o laa na osimiri; ma mmadu kaa isi, o laa be ndi mmuo.
    3. Oke obula jiri oso gbaba n’onu agwo bu azu ka o ji agbaputa.
    4. Okwu di nro na-eme ka onuma lachighaa azu.
    5. Enwe siri na onye ya ga agoro agugo bu nwa ya bu n’afo n’ihi na ya amaghi mgbe nke ya kwo n’azu jiri ghoo utu rachaa.
    6. O na abu anya na-enyo nti; nti a na-efe azu.
    7. Ichowa imata oke, tinyere ya azu n’onya.
    8. Azu dike anaghi eru ala.
    9. Onye riri oke riri azu; onye riri azu riri oke.
    10. Onye ara siri na onweghi ihe ya ga-agwa onye ji mma aga n’azu ya; na o bu mgbe o choro isi ya acho.
    11. Mere mere n’ihu, gwompiti n’azu.
    12. Oke gwara umu ya si, ” oburu na unu choro idi ndu zuo umu umu, unu elekwala anya na azu ejiri kwe onya.
    14. Asaa adighi n’ulo; asato bata, o laa azu.
    15. Okwom na-azu ma na ukwu m na-eru ala, ya hapu m ka m jiri ukwu m na- aga.
    16. Onye otu anya huru eke n’ogba wee laghachi azu, e mechaa, O biakwa Lee ya anya ozo wee so, ” ugbua anya m abuo ahula ya”.
    17. O na abu eriwo anu, ewere azu kwuo ugwo ya.
    18. Onye echiche buru uzo ogu, umunna ya asi na o dufuo ha, o kpere azu ha asi na o na-eze ndu.
    19. Ikpe mara eziokwu aka azu na aghugho di ya.
    20. O na abu onye bu uzo mara ezigbo akwa, ajuju egbuo ndi kpe azu.
    21. O na abu ikwe buru nri o gbakuta ala azu?
    22. Nnukwu azu bu n’ime abali ka o na-akpa nri.
    23. O na abu onye ohi na-ezu, ama agbara na-eso ya na azu.
    24. Anumanu ozo anaghi ekukwasi enwe mmiri n’azu.
    25. Ekwe onwu daziri ozu n’azu.
    26. Nganga buru uzo , odida esoro ya na azu.
    27. O bu oke no n’ulo gwara oke no n’ohia na azu di na ngiga.
    28. Ejekata ije laghachi azu, onye bu uzo ekpere azu.
    29. Mbe siri na the kpatara ya jiri kworo nsogbu n’azu bu na nsogbu bu nani nke ya.
    30. Azu enoghi ibe ya o naghi ebu.
    31. Akpa nya azu anaghi ama na ibe ya nyakwazi anu.




    0



    0
  10. ỌGBỤGBA OKWE: IKECHUKW ỌJỊ 6 n’ime ilu 6 ọ tụrụ, NNAEMEKA IBE 14 n’ime ilu 16 ọ tụrụ, UJU NWANEKEZI nwetara 22 n’ime ilu 31 ọ tụrụ. ORIAKỤ UJU NWANEKEZIE eturuwo ugo, Nnemeka Ibe bụ onye nke abụọ




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.