ONYE ISI NDI UWE OJII ETOOLA NDI EGWU BỌLỤ CRIME BURSTERS KA HA SIRI MERIE NDI EGWU BỌLỤ ENUGU RANGERS

Spread the love

Onye isi ndi uwe ojii na steeti Enugu bụ Mohammed Danmallam etoola ndi egwu bọlụ ndi uwe ojii na steeti ahụ bụ Crime Bursters Football Club ka ha siri merie ndi egwu bọlụ Enugu Rangers Internatiinal Football Club na isi nsoa.

Mmeria ndi egwu bọlụ nke ndi uwe ojii meriri ogbo ha ndi Rangers mere ka ndi egwu bọlụ Rangers nyadebe isi dịke ọkaibe na egwu bọlụ na steeti Enugu.

Danmallam nọrọ n’ụlọ ọrụ ya dị n’Enugu too ndi otu egwu bọlụ Crime Bursters n’ụbọchị Tusdee gara aga, mgbe ya na ndi ndi nta akụkọ ndi uwe ojii si Abuja kparịtara ụka n’isi ogige ụlọ ọrụ ndi uwe ojii di n’Enugu.

Onye isi ndi uwe ojiia toro onye nhazi otu egwu bọlụ Crime Burster, Ebere Amarizu, tokwaazi ndi otu nhazi otu egwu bọlụ ahụ nke ọbụ onye ntụzi aka bụ Edmund Ndụkanma nọ n’isi ya. Otoro ha maka ịdị uchu n’ọrụ ha nke wetere ha ugoa ha turu.

Danmallam sịrị na ọbụ site na igba mbọ nke onye ntụzi aka ndi otu egwu bọlụa mere ha jiri merie ndi otu egwu bọlụ Rangers nke Enugu bụ ihe anụtụbeghị na ntị na mkpokọba egwuregwu bọlụ nke steeti Enugu n’ime ọtụtụ afọ gara aga.

Danmallam sịrị na okwesịrị na aga-eto ma nyekwa ndi otu egwu bọlụ nke Crime Burster nkwado maka na ha emela ọfọma na egwuregwu nke akpọrọ Nigeria National League One (NLO) n’aha nkenke nke afọ 2017/2018. Ọ sịrị na ya ezigarala ndi isi ndi uwe ojii nọ n’Abuja ozi ka ha were mee ihe kwesịrị omume maka nkea.

Danmallam bụ onye nke kelere ndi niile nyere aka ịhụ na ndi otu egwu bọlụ nke Crime Burster bụzị agụ-owuru n’egwu bọlụ ma kwukwa na mgbe adịghị anya, na ndi otu egwu bọlụa ga-abụ ihe iyi égwù dịrị ndi ọbụla ha na ha ga-enwe asọm mpi egwu bọlụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.